Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isaiah 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 For look—the Father of heaven's armies is about to strip from Jerusalem and from Judah every support and supply: the whole supply of bread and the whole supply of water, Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile.
2 the warrior and the soldier, the judge and the prophet, the fortune-teller and the elder, Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha,
3 the commander of fifty and the man of rank, the counselor, the skilled craftsman, and the clever enchanter. na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ.
4 "I will make mere boys their officials, and childish whim will rule over them. “Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.”
5 The people will oppress one another, each man against his neighbor; the young will rise up against the old, and the lowly against the honored." Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ.
6 A man will seize his brother in his father's house and say, "You have a coat—you be our leader; take charge of this heap of ruins." Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.”
7 But on that day he will cry out, "I am no healer! There is no bread and no coat in my house—you will not make me leader of the people." Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.”
8 For Jerusalem has stumbled and Judah has fallen, because their words and their deeds are against our Father, defying his glorious presence. Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị.
9 The look on their faces testifies against them; they flaunt their sin like Sodom—they do not hide it. How terrible for them, for they have brought disaster on themselves! Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ.
10 Tell the righteous it will go well with them, for they will eat the fruit of their deeds. Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.
11 How terrible for the wicked! It will go badly for him, for what his hands have done will be repaid to him. Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.
12 My people—children are their oppressors, and women rule over them. My people, your guides lead you astray and have swallowed up the path you should walk. Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.
13 Our Father takes his stand to bring his case; he rises to judge the peoples. Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.
14 Our Father enters into judgment with the elders and officials of his people: "It is you who have devoured the vineyard; the plunder of the poor is in your houses. Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.
15 What do you mean by crushing my people and grinding the faces of the poor?" declares the Father of heaven's armies. Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
16 Our Father said: "Because the daughters of Zion are proud—walking with outstretched necks and flirting eyes, mincing along with quick little steps, jingling the anklets on their feet, Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.
17 therefore the Sovereign Father will strike the heads of the daughters of Zion with scabs, and our Father will lay bare their foreheads." Nʼihi ya, Onyenwe anyị ga-eme ka ọnya jupụta nʼisi ndị inyom Zayọn, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ha gharakwa inwe agịrị isi nʼisi ha.”
18 On that day the Sovereign Father will strip away their finery: the anklets, the headbands, the crescent ornaments, Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-anapụ ha ihe ịchọ mma ha niile, ma mgbaaka, ma ịchafọ ịgbado isi, ma ihe olu nke dị nʼụdịdị ọnwa ọhụrụ,
19 the earrings, the bracelets, the veils, ma ọlantị, ma mgbaaka, ma akwa e ji ekpuchi ihu,
20 the headdresses, the ankle chains, the sashes, the perfume flasks, the charms, ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;
21 the signet rings, the nose rings, ma ọlaaka ha niile na ọla imi ha niile,
22 the festival robes, the capes, the cloaks, the purses, ma uwe mmemme ha niile ma uwe mwụda niile, ma akwa akwa mgbochi, ma akpa nta niile,
23 the hand mirrors, the fine linen garments, the turbans, and the shawls. ma enyo ha niile, ma akwa ọcha niile, ma okpu ọma niile, ma mgbokwasị ha niile.
24 Then, instead of perfume there will be a stench; instead of a sash, a rope; instead of elegantly styled hair, baldness; instead of fine robes, a wrapping of coarse cloth; branding instead of beauty. Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.
25 Your men will fall by the sword, your warriors in the battle. Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.
26 Her gates will mourn and lament; stripped bare, she will sit on the ground. Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]