Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isaiah 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The vision of Isaiah son of Amoz concerning Judah and Jerusalem in the days of Uzziah, Jotham, Ahaz, and Hezekiah, kings of Judah. Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda.
2 Hear, heavens, and listen, earth, for our Heavenly Father has spoken: "Children I reared and brought up, but they have rebelled against me. Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa! Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu: “Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha, ma ha enupula isi megide m.
3 "The ox knows its owner, and the donkey its master's manger, but Israel does not know, my people do not understand. Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.”
4 Ah, sinful nation, a people weighed down with guilt, offspring of evildoers, children who act corruptly! They have forsaken our Father, they have spurned the Holy One of Israel—our Father—they have turned their backs and walked away. Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.
5 Why will you be beaten any longer? Why do you keep on rebelling? The whole head is sick, and the whole heart is faint. Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.
6 From the sole of the foot to the top of the head there is no healthy spot—only wounds, welts, and open sores, not cleaned or bandaged or soothed with oil. O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ.
7 Your land is desolate, your cities burned with fire; in your very presence foreigners devour your fields—a desolation, overthrown by strangers. Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.
8 And the daughter of Zion is left like a shelter in a vineyard, like a hut in a cucumber field, like a city under siege. Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.
9 If the Father of heaven's armies had not left us a few survivors, we would have become like Sodom, we would have been like Gomorrah. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.
10 Hear the word of our Father, you rulers of Sodom! Listen to the instruction of our Father, you people of Gomorrah! Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.
11 What are your endless sacrifices to me?" says our Father. "I have had my fill of burnt offerings of rams and the fat of fattened animals; I take no delight in the blood of bulls and lambs and goats. “Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ.
12 When you come to appear before me, who asked this of you—this trampling of my courts? Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
13 Stop bringing meaningless offerings! Your incense is detestable to me. New moons, Sabbaths, the calling of assemblies—I cannot stand wickedness mixed with your solemn gatherings. Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru.
14 Your new moons and your appointed feasts my soul hates; they have become a burden to me—I am weary of carrying them. Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
15 When you stretch out your hands in prayer, I will hide my eyes from you; even when you offer many prayers, I will not be listening. Your hands are full of blood. Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!
16 Wash yourselves; make yourselves clean. Take your evil deeds out of my sight; stop doing wrong. Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
17 Learn to do good; seek justice, set the oppressor right. Defend the orphan, stand up for the widow. Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
18 Come now, let us settle this together," says our Father. "Though your sins are like scarlet, they will be as white as snow; though they are red as crimson, they will become like wool. “Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
19 If you are willing and obedient, you will eat the good things of the land; Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
20 but if you refuse and rebel, you will be devoured by the sword. For the mouth of our Father has spoken." Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.
21 How the faithful city has become a prostitute! She was once full of justice; righteousness used to dwell in her—but now murderers. Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.
22 Your silver has become worthless slag, your choice wine diluted with water. Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke.
23 Your rulers are rebels, partners with thieves; they all love a bribe and chase after gifts. They do not defend the orphan, and the widow gets no hearing from them. Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha.
24 Therefore this is the declaration of the Sovereign Father, the Father of heaven's armies, the Mighty One of Israel—our Father: Ah, I will get relief from my adversaries and bring justice against my foes. Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.
25 I will turn my hand against you; I will smelt away your slag as with lye and remove all your impurities. Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu.
26 I will restore your judges as in days of old, your counselors as at the beginning. Afterward you will be called the City of Righteousness, the Faithful City. Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.”
27 Zion will be redeemed by justice, and those in her who repent, by righteousness. A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya.
28 But rebels and sinners will be broken together, and those who forsake our Father will be consumed. Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ.
29 You will be ashamed of the sacred oaks you delighted in; you will blush over the gardens you have chosen. “Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ.
30 For you will be like an oak whose leaves wither, like a garden without water. Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ.
31 The strong man will become tinder and his work a spark; both will burn together, with no one to put them out. Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ; ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu. Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]