Ugwu nsọ Onyenwe anyị
1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
2Nʼụbọchị ikpeazụ,ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzoberedịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile,ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”Iwu ga-esi na Zayọn pụta,okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.
4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5Unu ụlọ Jekọb, bịanụka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Ụbọchị Onyenwe anyị
6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị,bụ ụlọ Jekọb azụ.Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,ha bara ụba nke ukwuu.Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8Ala ha jupụtara nʼarụsị,ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.Ya mere, agbagharala ha.
10Gaanụ nʼime nkume,zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị,na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooronye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,nʼihi na ihe niile e buliri elu(ka a ga-eweda nʼala),
13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,na osisi ook niile nke Bashan,
14nye ugwu ukwu niile nke dị elu,na ugwu nta niile e buliri elu,
15nye ụlọ elu niile,na mgbidi niile e wusiri ike,
16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,na nʼọnụ e gwuru nʼala,nʼihi egwu Onyenwe anyị,na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20Nʼụbọchị ndị ahụ,ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,nke ha kpụrụ ma na-efe,hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume,na nʼime ọgba niile nke oke nkumenʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị,na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi.O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime,nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?