Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amos 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Hear this word our Father has spoken against you, children of Israel—against the whole family I brought up from Egypt: Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.
2 Of all the families of the earth, I have known only you; therefore I will hold you accountable for all your sins. “Naanị unu ka m họọrọ nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa; Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ nʼihi mmehie unu niile.”
3 Do two walk together, unless they have agreed to meet? Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?
4 Does a lion roar in the forest when he has no prey? Does a young lion cry out from his den if he has caught nothing? Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
5 Does a bird fall into a snare on the ground when there is no trap for it? Does a snare spring up from the earth when it has caught nothing? Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
6 If a ram's horn is blown in a city, will the people not tremble? If disaster comes to a city, has our Father not done it? Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
7 Surely the Sovereign Father does nothing without revealing his secret to his servants the prophets. Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
8 The lion has roared—who will not fear? The Sovereign Father has spoken—who can keep from prophesying? Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?
9 Proclaim over the strongholds in Ashdod and over the strongholds in the land of Egypt, and say: "Assemble on the mountains of Samaria and see the great uproar within her, and the oppression in her midst." Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị, “Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameria ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.”
10 They do not know how to do right, declares our Father—those who hoard up violence and plunder in their strongholds. “Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
11 So the Sovereign Father says: An enemy will surround the land, topple your defenses, and loot your strongholds. Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu; ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike, ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”
12 This is what our Father says: As a shepherd rescues two legs or a piece of an ear from the lion's mouth, so the children of Israel living in Samaria will be rescued—with a corner of a couch, part of a bed. Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, na nkuku isi ihe ndina na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.”
13 Hear, and testify against the house of Jacob, declares the Sovereign Father, the Father of heaven's armies: “Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.
14 On the day I punish Israel for his rebellions, I will also punish the altars of Bethel; the horns of the altar will be cut off and fall to the ground. “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.
15 I will strike the winter house along with the summer house; the houses of ivory will perish, and the great houses will come to an end, declares our Father. Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]