Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amos 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Hear this word, you cows of Bashan who are on the mountain of Samaria, you who oppress the poor, who crush the needy, who say to your masters, "Bring us something to drink!" Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
2 The Sovereign Father has sworn by his holiness: "The days are coming upon you when they will drag you away with hooks, and the last of you with fishhooks. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
3 You will go out through the breaches in the wall, each one straight ahead, and you will be flung out toward Harmon," declares our Father. Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4 "Come to Bethel and rebel; to Gilgal, and rebel all the more! Bring your sacrifices every morning, your tithes every three days. “Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ ọbụla.
5 Burn leavened bread as a thank offering, announce your freewill offerings, proclaim them aloud—for this is what you love to do, people of Israel!" declares the Sovereign Father. Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6 "I gave you empty stomachs in every city and a lack of bread in every place, yet you did not return to me," declares our Father. “E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
7 "I also withheld the rain from you while there were still three months to the harvest. I would send rain on one city and withhold it from another; one field would be rained on, and the field with no rain would dry up. “Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
8 So two or three cities would stagger to another city for water but not have enough to drink, yet you did not return to me," declares our Father. Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
9 "I struck you with blight and mildew; the locust devoured your many gardens and vineyards, your fig trees and your olive trees, yet you did not return to me," declares our Father. “Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
10 "I sent a plague against you like the one in Egypt; I killed your young men with the sword and carried off your horses. I made the stench of your camp rise into your nostrils, yet you did not return to me," declares our Father. “Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
11 "I overthrew some of you as I overthrew Sodom and Gomorrah, and you were like a stick snatched from the fire, yet you did not return to me," declares our Father. “Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, ma unu alọghachikwuteghị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
12 "Therefore this is what I will do to you, Israel; and because I will do this to you, prepare to meet your Father, O Israel!" “Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
13 For it is he who forms the mountains and creates the wind, who reveals his thoughts to mankind, who turns the dawn to darkness and treads on the heights of the earth—the Father of heaven's armies is his name. Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]