Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amos 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 This is what our Father says: For three sins of Moab, and for four, I will not revoke it—he burned the bones of Edom's king to lime. Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.
2 So I will send fire on Moab, and it will devour the strongholds of Kerioth; Moab will die amid the uproar, with shouting and the sound of the shofar. Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
3 I will cut off the ruler from her midst and kill all her officials with him, says our Father. Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
4 This is what our Father says: For three sins of Judah, and for four, I will not revoke it—they rejected our Father's instruction and did not keep his rules, and their lies led them astray, the same lies their ancestors followed. Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
5 So I will send fire on Judah, and it will devour the strongholds of Jerusalem. Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”
6 This is what our Father says: For three sins of Israel, and four, I won't relent—they sell the righteous for silver, the needy for a pair of sandals. Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
7 They trample the heads of the poor into the dust of the earth and push the afflicted off the road. A man and his father go to the same girl, profaning my holy name. Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.
8 They stretch out beside every altar on garments taken as collateral, and in the house of their God they drink the wine of those they have fined. Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
9 Yet it was I who destroyed the Amorite before them, as tall as the cedars and as strong as the oaks; I destroyed his fruit above and his roots below. “Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
10 And it was I who brought you up out of the land of Egypt and led you forty years in the wilderness, to take possession of the land of the Amorite. Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
11 I raised up some of your sons as prophets and some of your young men as Nazirites. Is this not so, people of Israel? declares our Father. “Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
12 But you made the Nazirites drink wine, and you commanded the prophets, saying, "Do not prophesy." “Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
13 Look, I will crush you in your place, as a cart full of sheaves crushes the ground beneath it. “Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
14 Even the swift will find no escape, the strong will not hold on to his strength, and the warrior will not save his life. Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
15 The archer will not stand his ground, the fleet-footed will not escape, and the horseman will not save his life. Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
16 Even the bravest of the warriors will flee away naked on that day, declares our Father. Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]