Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amos 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The words of Amos, a shepherd of Tekoa, which he saw about Israel when Uzziah ruled Judah and Jeroboam son of Joash ruled Israel, two years before the earthquake. Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
2 He said: Our Father roars from Zion, sounds his voice from Jerusalem; the shepherds' pastures mourn, and Carmel's summit withers. Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
3 This is what our Father says: For three sins of Damascus, and for four, I will not turn it back, because they threshed Gilead with sledges of iron. Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.
4 So I will send a fire upon the house of Hazael, and it will devour the strongholds of Ben-hadad. Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
5 I will break the gate-bar of Damascus, and cut off the one who sits enthroned in the Valley of Aven and the one who holds the scepter in Beth-eden; and the people of Aram will go into exile to Kir, says our Father. Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
6 So says our Father: For three crimes of Gaza, and for four, I will not reverse it—they exiled an entire people, handing them over to Edom. Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Gaza, e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha, ranye nʼaka ndị Edọm.
7 So I will send a fire upon the wall of Gaza, and it will devour her strongholds. Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
8 I will cut off the one enthroned in Ashdod and the one who holds the scepter in Ashkelon; I will turn my hand against Ekron, and the remnant of the Philistines will perish, says the Sovereign Father. Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.
9 So says our Father: For three sins of Tyre, and for four, I will not relent, because they handed over a whole community of exiles to Edom and forgot the covenant of brothers. Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
10 So I will send a fire upon the wall of Tyre, and it will devour her strongholds. Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
11 This is what our Father says: For three sins of Edom, and for four, I will not relent, because he chased his brother with the sword, stifled all compassion, his anger tore endlessly, and he kept his wrath forever. Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
12 So I will send a fire upon Teman, and it will devour the strongholds of Bozrah. Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman; ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
13 This is what our Father says: For three sins of the Ammonites, and for four, I will not relent, because they ripped open Gilead's pregnant women to enlarge their border. Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
14 So I will kindle a fire on the wall of Rabbah, and it will devour her strongholds, with shouting on the day of battle, with a tempest on the day of the whirlwind. Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba. Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike. Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe, na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.
15 And their king will go into exile, he and his officials together, says our Father. Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha, ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.” Ka Onyenwe anyị sịrị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]