Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joel 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 "For look, in those days and at that time, when I restore the fortunes of Judah and Jerusalem, “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke Juda na Jerusalem,
2 I will gather all the nations and bring them down to the Valley of Jehoshaphat. There I will judge them on behalf of my people, my inheritance Israel, whom they scattered among the nations; for they divided up my land, na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na Ndagwurugwu Jehoshafat. Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m Izrel. Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha.
3 and they cast lots for my people. They traded a boy for a prostitute, and sold a girl for wine to drink. Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.
4 "Now what do you have against me, Tyre and Sidon, and all the regions of Philistia? Are you repaying me for something I have done? If you are paying me back, I will swiftly and speedily bring what you have done back on your own heads. “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.
5 For you took my silver and my gold and carried my finest treasures into your temples. Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.
6 You sold the people of Judah and Jerusalem to the Greeks, to send them far away from their own land. Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.
7 "But look, I am rousing them from the place to which you sold them, and I will bring what you have done back on your own heads. “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.
8 I will sell your sons and daughters to the people of Judah, and they will sell them to the Sabeans, to a nation far away—for our Father has spoken." Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
9 Proclaim this among the nations: Prepare for war! Rouse the warriors! Let all the fighting men draw near and come up. Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha.
10 Beat your plowshares into swords and your pruning hooks into spears; let the weakling say, "I am a warrior." Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!”
11 Hurry and come, all you surrounding nations, and gather yourselves there. Bring down your warriors, our Father. Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike Onyenwe anyị!
12 "Let the nations rouse themselves and come up to the Valley of Jehoshaphat; for there I will sit to judge all the surrounding nations. “Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe.
13 Swing the sickle, for the harvest is ripe. Come, trample, for the winepress is full and the vats overflow—for their wickedness is great." Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.”
14 Multitudes, multitudes in the valley of decision! For the day of our Father is near in the valley of decision. Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ.
15 The sun and the moon grow dark, and the stars hold back their light. Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè.
16 Our Father roars from Zion and raises his voice from Jerusalem; the heavens and the earth tremble. But our Father is a refuge for his people, a stronghold for the children of Israel. Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
17 "Then you will know that I am your Father, living in Zion, my holy mountain. Jerusalem will be holy, and foreigners will never pass through it again. “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
18 "And in that day the mountains will drip with sweet wine, the hills will flow with milk, and all the streambeds of Judah will run with water. A spring will flow from my house and water the Valley of Acacias. “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
19 Egypt will become a wasteland and Edom a desolate wilderness, because of the violence done to the people of Judah, in whose land they shed innocent blood. Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
20 But Judah will be inhabited forever, and Jerusalem through all generations. Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.
21 I will cleanse the guilt of the blood shed against them—which I have not yet cleansed—for our Father dwells in Zion." Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]