Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joel 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Blow the ram's horn in Zion; sound the alarm on my holy mountain! Let all who live in the land tremble, for the day of our Father is coming—it is near: Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa, ọ na-abịaru nso.
2 A day of darkness and gloom, a day of clouds and thick darkness. Like dawn spreading across the mountains, a great and mighty army comes—nothing like it has ever been before, and nothing like it will ever come again. Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
3 Before them fire devours, and behind them a flame blazes. The land before them is like the garden of Eden, but behind them a desolate wilderness—and nothing escapes them. Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
4 They look like horses; like war horses they charge. Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.
5 Like the rumbling of chariots they leap over the mountaintops, like the crackling of flame consuming stubble, like a mighty army drawn up for battle. Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
6 Before them peoples writhe in anguish; every face grows pale. Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.
7 Like warriors they charge; like soldiers they scale the wall. Each marches in line, never swerving from its course. Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
8 They do not jostle one another; each keeps to its own path. They burst through the weapons and are not halted. Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
9 They rush upon the city; they run along the wall. They climb into the houses; through the windows they enter like a thief. Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
10 Before them the earth quakes, the heavens tremble. The sun and moon grow dark, and the stars no longer shine. Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
11 Our Father raises his voice at the head of his army; his camp is very great, and mighty are those who carry out his word. The day of our Father is great and utterly terrifying—who can endure it? Olu Onyenwe anyị dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya?
12 "Yet even now," declares our Father, "return to me with all your heart, with fasting, with weeping, and with mourning. “Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
13 "Tear your hearts, not your garments. Return to your Father, for he is gracious and compassionate, slow to anger and abounding in covenant love, and he relents from sending disaster. Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
14 Who knows? He may turn and relent and leave behind a blessing—a grain offering and a drink offering for your Father." Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
15 Blow a shofar in Zion; consecrate a fast; call a sacred assembly. Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.
16 Gather the people; consecrate the assembly; bring together the elders; gather the children, even the infants nursing at the breast. Let the bridegroom come out of his room, and the bride from her chamber. Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
17 Let the priests who minister before our Father weep between the portico and the altar. Let them say, "Spare your people, our Father, and do not make your inheritance an object of scorn, a byword among the nations. Why should they say among the peoples, 'Where is their God?'" Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”
18 Then our Father became jealous for his land and took pity on his people. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.
19 Our Father answered his people: "Look, I am sending you grain, new wine, and oil, and you will be satisfied with them. Never again will I make you an object of scorn among the nations." Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.
20 "I will drive the northern army far from you, pushing it into a parched and desolate land—its front ranks into the Dead Sea and its rear into the Mediterranean Sea. Its stench will rise; its foul smell will go up, for it has done monstrous things. “Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.
21 Don't be afraid, land; rejoice and be glad, for our Father has done great things! Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.
22 Do not be afraid, you animals of the field, for the pastures of the wilderness are turning green; the tree bears its fruit; the fig tree and the vine yield their riches. Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.
23 Be glad, children of Zion, and rejoice in your Father, for he has given you the autumn rain to show his faithfulness; he sends down for you abundant showers, the autumn and the spring rains, as before. Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.
24 The threshing floors will be full of grain; the vats will overflow with new wine and oil. Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
25 I will repay you for the years the locusts have eaten—the swarming locust, the young locust, the destroying locust, and the cutting locust—my great army that I sent among you. “Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
26 You will eat your fill and be satisfied, and you will praise the name of your Father, who has dealt wondrously with you; and never again will my people be put to shame. Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
27 Then you will know that I am in the midst of Israel, and that I am your Father, and there is no other; and never again will my people be put to shame. Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
28 "And afterward, I will pour out my Spirit on all flesh. Your sons and your daughters will prophesy, your old men will dream dreams, your young men will see visions. “Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
29 Even on the male servants and the female servants in those days I will pour out my Spirit. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
30 I will show wonders in the heavens and on the earth—blood and fire and columns of smoke. Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
31 The sun will be turned to darkness and the moon to blood before the great and awesome day of our Father comes." Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
32 And this will happen: everyone who calls on the name of the Lord will be saved; for on Mount Zion and in Jerusalem there will be deliverance, as our Father has said, among the survivors whom our Father calls. Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]