Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joel 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The word of our Father that came to Joel son of Pethuel. Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Juel nwa Petuel.
2 Hear this, you elders; listen, all who live in this land. Has anything like this happened in your days, or in the days of your ancestors? Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye; geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a. Ihe dị otu a o meela na ndụ unu, ka o mere na ndụ nna nna unu ha?
3 Tell your children about it, and let your children tell their children, and their children the next generation. Gwanụ ya ụmụ unu, ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha, ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
4 What the cutting locust spared, the swarming locust ate; what the swarming locust spared, the hopping locust ate; and what the hopping locust spared, the destroying locust ate. Ihe igurube rifọrọ ka igurube ukwu richara, ihe igurube ukwu rifọrọ, ka ụmụ igurube richara, ihe ụmụ igurube rifọrọ ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.
5 Wake up, you drunkards, and weep; wail, all you wine drinkers, over the sweet wine, for it has been cut off from your lips. Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa. Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya; kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ, nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
6 "For a nation has invaded my land, mighty and beyond number; its teeth are the teeth of a lion, and it has the fangs of a lioness. O nwere mba bịakwasịrị ala m, usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ; nke nwere eze dịka ọdụm, nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
7 It has devastated my vines and splintered my fig tree; it has stripped off their bark and cast it aside, leaving their branches bare and white." Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
8 Wail like a virgin dressed in mourning clothes for the husband of her youth. Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
9 The grain offering and the drink offering are cut off from the house of our Father; the priests, the ministers of our Father, mourn. Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
10 The field is devastated, the ground mourns; for the grain is destroyed, the new wine dries up, the oil fails. Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
11 Be ashamed, you farmers; wail, you grape growers, over the wheat and the barley, for the harvest of the field has perished. Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
12 The vine is dried up, and the fig tree withers; the pomegranate, the palm, and the apple—all the trees of the field are dried up. Surely joy has withered away from all people. Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.
13 Put on mourning clothes and lament, you priests; wail, you ministers of the altar. Come, spend the night in mourning clothes, you ministers of my Father; for the grain offering and the drink offering are withheld from the house of your Father. Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ, kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja. Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị unu ndị na-ejere Chineke m ozi nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ ịbata nʼụlọ Chineke unu.
14 Declare a fast; call a sacred assembly. Gather the elders and all who live in the land to the house of our Father, and cry out to our Father. Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ. Kpọọnụ nzukọta dị nsọ. Chịkọtaanụ ndị okenye na ndị niile bi nʼala a, ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu; ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.
15 Alas for the day! For the day of our Father is near, and it will come like destruction from the Almighty. Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso. Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
16 Is not the food cut off right before our eyes—joy and gladness gone from the house of our Father? Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị wezuga ihe oriri niile, Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?
17 The seeds shrivel in the parched ground; the storehouses are desolate, the granaries are torn down, for the grain has dried up. Mkpụrụ ubi akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala. Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu, a kwatuola ọba niile, nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
18 How the animals groan! The herds of cattle wander in confusion because they have no pasture; even the flocks of sheep suffer. Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.
19 To you, our Father, I call, for fire has devoured the pastures of the wilderness, and flame has burned all the trees of the field. Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku, nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ. Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
20 Even the wild animals cry out to you, for the streams have dried up, and fire has devoured the pastures of the wilderness. Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]