Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My son, pay attention to my wisdom; listen closely to my understanding, Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.
2 so that you may guard discretion and your lips may preserve knowledge. Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.
3 For the lips of the forbidden woman drip honey, and her mouth is smoother than oil, Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.
4 but in the end she is bitter as poison, sharp as a double-edged sword. Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.
5 Her feet go down to death; her steps take hold of the grave. Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.
6 She gives no thought to the path of life; her ways wander, and she does not know it. Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
7 And now, my sons, listen to me, and do not turn away from the words of my mouth. Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.
8 Keep your way far from her, and do not go near the door of her house, Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,
9 lest you give your honor to others and your years to one who is cruel, ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.
10 lest strangers take their fill of your strength, and your hard-earned labors go to the house of a foreigner, Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.
11 and at your end you groan, when your flesh and body are consumed, Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.
12 and you say, "How I hated discipline, and my heart despised correction! Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!
13 I did not listen to the voice of my teachers or heed my instructors. Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.
14 I was at the brink of utter ruin in the midst of the assembled congregation." Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.”
15 Drink water from your own cistern, flowing water from your own well. Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.
16 Should your springs overflow in the streets, your streams of water in the public squares? Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?
17 Let them be yours alone, and not shared with strangers. Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.
18 May your fountain be blessed, and rejoice in the wife of your youth, Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
19 a loving doe, a graceful deer. May her love satisfy you always; may you be captivated continually by her love. Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
20 Why then, my son, should you be captivated by a forbidden woman and embrace another man's wife? Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
21 For a man's ways are before the eyes of our Father, and he examines all the man's paths. Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.
22 The wicked are caught by their own wrongdoing and held fast in the cords of their sin. Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.
23 He will die for lack of discipline, and he will go astray because of his great foolishness. Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]