Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My son, if you have put up security for your neighbor, if you have shaken hands in pledge for a stranger, Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe,
2 you have been snared by the words of your mouth, caught by the words of your mouth. ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.
3 Then do this, my son, and free yourself, for you are now at your neighbor's mercy: go, humble yourself, and plead with your neighbor. Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.
4 Give no sleep to your eyes, no slumber to your eyelids. Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.
5 Free yourself like a gazelle from the hand, like a bird from the hand of the trapper. Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
6 Go to the ant, you sluggard; consider her ways and be wise. Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
7 Without having any chief, officer, or ruler, Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,
8 she prepares her bread in summer and gathers her food in harvest. ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.
9 How long will you lie there, sluggard? When will you arise from your sleep? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
10 A little sleep, a little slumber, a little folding of the hands to rest, Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
11 and poverty will come upon you like a robber, and scarcity like an armed man. ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
12 A worthless person, a wicked man, goes about with crooked speech, Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
13 winks with his eyes, signals with his feet, points with his fingers, onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
14 with perverted heart he devises evil, continually sowing discord; Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
15 therefore calamity will come upon him suddenly; in a moment he will be broken beyond healing. Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
16 There are six things our Father hates, seven that are detestable to him: Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17 haughty eyes, a lying tongue, and hands that shed innocent blood, Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18 a heart that devises wicked plans, feet that hurry to run to evil, Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19 a false witness who breathes out lies, and one who sows discord among brothers. onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
20 My son, keep your father's commandment, and do not forsake your mother's teaching. Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
21 Bind them on your heart always; tie them around your neck. Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.
22 When you walk, they will lead you; when you lie down, they will watch over you; and when you awake, they will talk with you. Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
23 For the commandment is a lamp and the teaching a light, and the reproofs of discipline are the way of life, Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,
24 to keep you from the evil woman, from the smooth tongue of the adulteress. idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.
25 Do not desire her beauty in your heart, and do not let her capture you with her eyelashes; Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.
26 for the price of a prostitute is only a loaf of bread, but a married woman hunts down a precious life. Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
27 Can a man carry fire next to his chest and his clothes not be burned? Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ?
28 Or can one walk on hot coals and his feet not be scorched? Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
29 So is he who sleeps with his neighbor's wife; none who touches her will go unpunished. Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
30 People do not despise a thief if he steals to satisfy his appetite when he is hungry, Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
31 but if he is caught, he will pay sevenfold; he will give all the goods of his house. Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
32 He who commits adultery lacks sense; he who does it destroys himself. Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
33 He will get wounds and dishonor, and his disgrace will not be wiped away. A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.
34 For jealousy makes a man furious, and he will show no mercy in the day of vengeance. Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
35 He will accept no compensation; he will refuse no matter how large the bribe. Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]