Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Listen, my children, to a father's instruction; pay attention, and gain understanding. Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
2 I am giving you sound teaching, so do not abandon my instruction. Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
3 For I too was a son to my father, tender and the only beloved of my mother. Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
4 He taught me and said, "Let your heart hold on to my words; keep my commands and you will live. ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
5 Get wisdom, get understanding; do not forget, and do not turn away from the words of my mouth. Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
6 Do not forsake her, and she will protect you; love her, and she will watch over you. Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
7 The beginning of wisdom is this: get wisdom; and with all you acquire, get understanding. Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
8 Cherish her, and she will lift you high; embrace her, and she will bring you honor. Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
9 She will set a garland of grace on your head; she will present you with a crown of glory." Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
10 Listen, my son, and receive my words, and the years of your life will be many. Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
11 I have taught you the way of wisdom; I have led you along straight paths. M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12 When you walk, your steps will not be held back; and when you run, you will not stumble. Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13 Hold on to instruction, do not let go; guard her, for she is your life. Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14 Do not set foot on the path of the wicked, and do not walk in the way of evildoers. Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
15 Avoid it, do not travel on it; turn away from it and pass on by. Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16 For they cannot sleep unless they do wrong; they are robbed of rest unless they make someone stumble. nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17 They feed on the bread of wickedness and drink the wine of violence. Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
18 But the path of the righteous is like the light of dawn, shining brighter and brighter until the full light of day. Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19 The way of the wicked is like deep darkness; they do not know what makes them stumble. Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
20 My son, pay attention to my words; listen closely to my sayings. Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
21 Never lose sight of them; keep them deep within your heart. Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22 For they are life to those who find them, and healing to their whole body. nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
23 Above all else, guard your heart, for everything you do flows from it. Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24 Keep crooked speech from your mouth, and keep deceitful lips far from you. Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25 Let your eyes look straight ahead; fix your gaze directly before you. Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26 Give careful thought to the path for your feet, and all your ways will be secure. Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27 Do not turn to the right or the left; keep your foot away from evil. Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]