Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My son, do not forget my teaching, but let your heart keep my commandments, Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.
2 for they will add length of days and years of life and peace to you. Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
3 Do not let covenant love and faithfulness leave you; bind them around your neck, write them on the tablet of your heart. Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4 So you will find favor and a good reputation with our Father and with people. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
5 Trust in our Father with all your heart, and do not lean on your own understanding. Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
6 In all your ways know him, and he will make your paths straight. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
7 Do not be wise in your own eyes; fear our Father, and turn away from evil. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8 This will bring healing to your body and refreshment to your bones. Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
9 Honor our Father with your wealth and with the firstfruits of all your produce, Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
10 then your barns will be filled with plenty, and your vats will overflow with new wine. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
11 My son, do not despise the discipline of our Father or be weary of his correction, Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
12 for our Father disciplines the one his heart loves, just as a father disciplines the son he delights in. Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
13 Blessed is the one who finds wisdom, and the one who gains understanding, Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
14 for the gain from her is better than gain from silver, and her profit better than gold. Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15 She is more precious than jewels, and nothing you desire can compare with her. Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
16 Long life is in her right hand; in her left hand are riches and honor. Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
17 Her ways are pleasant, and all her paths are peace. Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
18 She is a tree of life to those who take hold of her; those who hold her fast are called blessed. Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
19 Our Father by wisdom founded the earth; by understanding he established the heavens; Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
20 by his knowledge the depths burst open, and the clouds drop down the dew. Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
21 My son, do not lose sight of these; keep sound wisdom and discretion, Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
22 and they will be life for your soul and an adornment for your neck. nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
23 Then you will walk on your way securely, and your foot will not stumble. Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
24 If you lie down, you will not be afraid; when you lie down, your sleep will be sweet. Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
25 Do not be afraid of sudden terror, or of the ruin of the wicked when it comes, Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
26 for our Father will be your confidence and will keep your foot from being caught. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
27 Do not withhold good from those who deserve it, when it is in your power to do it. Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
28 Do not say to your neighbor, "Go, and come back, and tomorrow I will give it"—when you have it with you. A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
29 Do not plot evil against your neighbor, who lives trustingly beside you. Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
30 Do not quarrel with anyone for no reason, when he has done you no harm. Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
31 Do not envy a violent man, and do not choose any of his ways, Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.
32 for the devious person is detestable to our Father, but he takes the upright into his confidence. Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
33 The curse of our Father is on the house of the wicked, but he blesses the home of the righteous. Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
34 Toward the mockers he is scornful, but to the humble he gives grace. Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
35 The wise will inherit honor, but fools get only disgrace. Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]