Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My son, if you receive my words and store up my commandments within you, Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
2 making your ear attentive to wisdom and turning your heart toward understanding; tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta.
3 yes, if you call out for insight and raise your voice for understanding, E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
4 if you seek it like silver and search for it as for hidden treasure, ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo,
5 then you will understand the fear of our Father and find the knowledge of our Father. mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
6 For our Father gives wisdom; from his mouth come knowledge and understanding. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
7 He stores up sound wisdom for the upright; he is a shield to those who walk in integrity, Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
8 guarding the paths of justice and watching over the way of his faithful ones. Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
9 Then you will understand righteousness and justice and fairness—every good path. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
10 For wisdom will enter your heart, and knowledge will be pleasant to your soul; Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
11 discretion will watch over you, and understanding will guard you, Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
12 rescuing you from the way of evil, from men who speak twisted things, Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
13 who abandon the paths of uprightness to walk in the ways of darkness, ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
14 who delight in doing evil and rejoice in the perversity of evil, ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
15 whose paths are crooked, and who are devious in their ways. Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
16 Wisdom will rescue you also from the forbidden woman, from the stranger with her smooth words, Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
17 who forsakes the companion of her youth and forgets the covenant of her Father. Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
18 For her house sinks down to death, and her paths to the dead. Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.
19 None who go to her return, nor do they reach the paths of life. Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
20 So you will walk in the way of the good and keep to the paths of the righteous. Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
21 For the upright will live in the land, and those of integrity will remain in it; nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
22 but the wicked will be cut off from the land, and the treacherous will be torn away from it. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]