Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The proverbs of Solomon, son of David, king of Israel: Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2 To know wisdom and instruction, to understand words of insight, Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
3 to receive instruction in wise conduct, in righteousness, justice, and fairness, nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4 to give prudence to the simple, knowledge and discretion to the young, Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5 let the wise also hear and increase in learning, and let the one who understands gain guidance, Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6 to understand a proverb and a parable, the words of the wise and their riddles. Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7 The fear of our Father is the beginning of knowledge; fools despise wisdom and instruction. Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
8 Listen, my son, to your father's instruction, and don't turn away from your mother's teaching, Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9 for they are a graceful garland for your head and pendants for your neck. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
10 My son, if sinners entice you, do not give in. Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!
11 If they say, "Come with us, let us lie in wait for blood, let us ambush the innocent without cause; Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
12 like the grave let us swallow them alive, and whole, like those who go down to the pit; Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.
13 we will find all kinds of precious goods, we will fill our houses with plunder; Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
14 throw in your lot with us; we will all share one purse," Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15 my son, do not walk in the way with them; hold back your foot from their paths, Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16 for their feet run to evil, and they hurry to shed blood. nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
17 For a net spread out before any bird's eyes catches nothing; Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
18 but these lie in wait for their own blood; they ambush their own lives. Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
19 Such are the ways of everyone greedy for unjust gain; it takes away the life of its possessors. Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
20 Wisdom cries aloud in the street; in the open squares she lifts her voice. Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.
21 At the head of the noisy streets she calls out; at the entrance of the city gates she speaks: Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
22 "How long, simple ones, will you love being simple? How long will mockers delight in their mocking and fools hate knowledge? “Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23 If you respond to my correction, I, Wisdom, will pour out my spirit on you; I will make my words known to you. Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.
24 Because I have called and you refused, I stretched out my hand and no one paid attention, Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
25 and you ignored all my counsel and rejected all my correction, ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26 I also will laugh at your calamity; I will mock when terror overtakes you, ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27 when terror overtakes you like a storm and your calamity comes like a whirlwind, when distress and anguish come upon you. Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28 Then they will call on me, but I will not answer; they will seek me earnestly but will not find me, “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29 because they hated knowledge and did not choose the fear of our Father, Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
30 they rejected my counsel and despised all my correction. Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya.
31 So they will eat the fruit of their own way and have their fill of their own schemes. Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
32 For the waywardness of the simple will kill them, and the complacency of fools will destroy them; Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
33 but whoever listens to me will dwell secure and be at ease, without dread of disaster." Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]