Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Zephaniah 2 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Oku akpọrọ Juda ka ọ chegharịa

1Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu,unu ndị mba ihe ihere dịrị.

2Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ,a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu,tupu iwe ọkụ Onyenwe anyịabịakwasị gị,tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyịabịakwasị gị.

3Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ,unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu.Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi,ma eleghị anya, a ga-echebe ununʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.

Ahụhụ dịrị Filistia

4Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza,obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu.Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd;a ga-ehopukwa Ekrọn.

5Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri,unu bụ ndị Keret;okwu Onyenwe anyị na-emegide unu,Kenan, ala ndị Filistia.Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi,ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”

6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ,ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụna ọgba igwe ewu na atụrụ.

7Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiriga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda,ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa.Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu,dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi.Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha,mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.

Ahụhụ dịrị Moab na Amọn

8“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab,na ịkwa emo niile nke ndị Amọn,nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke mna-anya isi na ha ga-ewere ala ha.

9Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,”otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,bụ Chineke Izrel, kwubiri ya,“aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm,mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra.Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara,na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha,ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”

10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megidendị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.

Ahụhụ dịrị Kush

12“Unu ndị Itiopia,a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”

Ahụhụ dịrị Asịrịa

13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,laa Asịrịa nʼiyi.Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,ha na ihe e kere eke dị iche iche.Ikwighịkwighị nke ọzara na okwologa-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.

15Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri,nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla;nke na-asị onwe ya,“Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.”Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu;lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi.Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ,ma fufekwaa isi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]