Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Proverbs 31 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The words of King Lemuel—an oracle his mother taught him: Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
2 What, my son? What, son of my womb? What, son of my vows? Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
3 Do not give your strength to women, or your ways to those who destroy kings. Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
4 It is not for kings, Lemuel—not for kings to drink wine, or for rulers to crave strong drink. Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
5 For if they drink, they will forget what is decreed and pervert the rights of all the oppressed. Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
6 Give strong drink to one who is perishing, and wine to those in bitter distress. Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
7 Let them drink and forget their poverty, and remember their misery no more. Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
8 Open your mouth for the voiceless, for the rights of all who are left destitute. Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
9 Open your mouth, judge righteously, and defend the rights of the poor and needy. Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
10 A woman of valor—who can find her? She is far more precious than jewels. Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
11 The heart of her husband trusts in her, and he will lack nothing of value. Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
12 She does him good and not harm, all the days of her life. Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
13 She seeks out wool and flax, and works with willing hands. Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
14 She is like the merchant ships, bringing her food from afar. Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
15 She rises while it is still night, provides food for her household, and portions for her servant girls. Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
16 She considers a field and buys it; from the fruit of her hands she plants a vineyard. Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
17 She wraps herself in strength and makes her arms strong. Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
18 She perceives that her trading is profitable; her lamp does not go out at night. Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
19 She puts her hands to the spinning staff, and her hands grasp the spindle. Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
20 She opens her hand to the poor and reaches out her hands to the needy. Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
21 She has no fear for her household when it snows, for all her household are clothed in scarlet. Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
22 She makes coverings for herself; her clothing is fine linen and purple. Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
23 Her husband is known in the gates, when he sits among the elders of the land. Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
24 She makes linen garments and sells them, and supplies sashes to the merchants. Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
25 Strength and dignity are her clothing, and she laughs at the days to come. Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
26 She opens her mouth with wisdom, and faithful instruction is on her tongue. Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
27 She watches over the ways of her household and does not eat the bread of idleness. Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
28 Her children rise up and call her blessed; her husband also, and he praises her: Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
29 "Many daughters have done valiantly, but you surpass them all." Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
30 Charm is deceptive and beauty is fleeting, but a woman who reveres our Father—she will be praised. Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
31 Give her the fruit of her hands, and let her works praise her in the gates. E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]