Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The words of the Teacher, son of David, king in Jerusalem. Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.
2 "Utterly fleeting," says the Teacher, "utterly fleeting! Everything is fleeting." Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.
3 What does a person gain from all the labor at which they toil under the sun? Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
4 A generation goes, and a generation comes, but the earth remains forever. Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa, ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.
5 The sun rises and the sun sets, and hurries back to the place where it rises. Anyanwụ na-awa, na-adakwa, ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.
6 The wind blows to the south and turns to the north; round and round it goes, ever returning on its circuits. Ifufe na-efe gaa na ndịda; feekwa gburugburu gaa nʼugwu, ọ na-efegharị gburugburu ebe niile; na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.
7 All the streams run to the sea, yet the sea is never full; the streams return to their source and flow again. Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri ma oke osimiri ejughị eju. Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a, malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.
8 All things are wearisome, more than anyone can express; the eye is not satisfied with seeing, nor the ear filled with hearing. Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ; ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ. Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị. Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.
9 What has been is what will be, and what has been done is what will be done; there is nothing new under the sun. Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ. Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.
10 Is there anything anyone can point to and say, "Look, this is new"? It was already here, in the ages before us. Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị, “Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”? Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga, nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.
11 There is no remembrance of those who came before, and even those yet to come will not be remembered by those who follow them. Anaghị echeta ndị mgbe ochie, otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa ndị ga-eso ha agakwaghị echeta ha.
12 I, the Teacher, was king over Israel in Jerusalem. Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.
13 I gave my heart to seek and explore by wisdom all that is done under heaven—a miserable task God has given mankind to struggle with. Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
14 I saw all the deeds done under the sun, and look—it is all fleeting, a chasing after wind. Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
15 What is crooked cannot be made straight, and what is lacking cannot be counted. Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie. Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.
16 I told myself, "Look, I have grown great and gained more wisdom than all who ruled Jerusalem before me; my heart has seen much wisdom and knowledge." Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”
17 I set my mind to know wisdom, and madness and foolishness; I learned this too is a chasing after the wind. Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
18 For with much wisdom comes much grief, and the more knowledge, the more sorrow. Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta, oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]