Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In my heart I said, "Come, I'll test you with pleasure; enjoy what's good." But this too was fleeting. Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu.
2 I said of laughter, "It is madness," and of pleasure, "What does it accomplish?" “Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?”
3 I explored in my heart how to cheer my body with wine—my heart still guiding me with wisdom—and to grasp foolishness, until I might see what is good for people to do under heaven the few days of their lives. Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.
4 I undertook great works. I built houses for myself and planted vineyards. Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị.
5 I made myself gardens and parks, and planted in them all kinds of fruit trees. Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha,
6 I made myself pools of water to irrigate a forest of growing trees. wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
7 I bought male and female slaves, and had home-born slaves too. I owned larger herds and flocks than anyone before me in Jerusalem. Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem.
8 I gathered for myself silver and gold, the treasure of kings and provinces. I got male and female singers, and men's delights—many concubines. Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.
9 So I became great, greater than all before me in Jerusalem; and my wisdom stayed with me. E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.
10 Whatever my eyes wanted I did not withhold. I refused my heart no joy, for my heart delighted in all my work, and this was my reward for all my work. Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere; egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla. Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile, nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.
11 Then I surveyed all my hands had done and the toil I spent doing it, and it was all fleeting, chasing wind; nothing was gained under the sun. Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.
12 So I turned to consider wisdom, madness, and foolishness. For what can the king's successor do? Only what has already been done. Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?
13 I saw that wisdom has more gain than foolishness, as light has more than darkness. Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
14 The wise person has eyes in his head, but the fool walks in darkness. And yet I perceived that the same fate befalls them all. Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
15 Then I thought, "The fool's fate is mine too. So why have I been so very wise?" And I decided this too is fleeting. Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
16 The wise, like the fool, will not be remembered for long; in days to come both are forgotten. How the wise die just like fools! Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
17 So I hated life, because the work done under the sun grieved me; it is all fleeting, a chasing after wind. Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
18 I hated all my labor under the sun, since I must leave it to the one after me. Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
19 Who knows if he will be wise or a fool? Yet he will control all I worked for with my wisdom under the sun. This too is fleeting. Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.
20 So I gave my heart up to despair over all the toil I labored at under the sun. Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
21 One may work with wisdom, knowledge, and skill, yet must leave it all to be enjoyed by someone who never worked for it. This too is fleeting, a great evil. Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.
22 What does a person gain from all the toil and striving of heart he labors at under the sun? Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?
23 All his days bring sorrow, his work grief; even at night his mind gets no rest. This too is fleeting. Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.
24 Nothing is better for a person than to eat, drink, and enjoy his work. This too, I saw, is from God's hand, Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke.
25 for apart from him, who can eat or who can find enjoyment? Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke?
26 God gives wisdom, knowledge, and joy to the person who pleases him, but to the sinner he gives the work of gathering and collecting, only to hand it to one who pleases God. This too is fleeting, chasing wind. Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]