Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 For everything there is a season, and a time for every matter under heaven: Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
2 a time to be born, and a time to die; a time to plant, and a time to uproot what is planted; Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,
3 a time to kill, and a time to heal; a time to tear down, and a time to build up; oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
4 a time to weep, and a time to laugh; a time to mourn, and a time to dance; oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
5 a time to throw away stones, and a time to gather stones together; a time to embrace, and a time to refrain from embracing; oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
6 a time to seek, and a time to lose; a time to keep, and a time to throw away; oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
7 a time to tear, and a time to sew; a time to be silent, and a time to speak; oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
8 a time to love, and a time to hate; a time for war, and a time for peace. oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
9 What gain has the worker from his toil? Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
10 I have seen the task that God has given people to keep them busy. Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
11 He made everything beautiful in its time, and set eternity in the human heart—yet no one can grasp what God has done from start to end. O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
12 I know nothing is better for them than to enjoy life and do good while they live. Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
13 Also, that everyone eat, drink, and find satisfaction in all their work—this is God's gift. Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
14 I know all God does lasts forever; nothing can be added, nothing removed. He has done it so people will fear before him. Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
15 What is has already been, and what will be has already been; and God seeks out what was driven away. Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
16 I also saw under the sun: evil in the place of judgment, and evil in the place of righteousness. Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
17 I said in my heart: "God will judge the righteous and the wicked, for there's a time for every matter and every deed, there." A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
18 I said in my heart: "God tests people, so that they may see they're just animals." Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
19 Humans and animals share one fate: one dies as the other dies; both have the same breath. Humans have no advantage over animals—all is vapor. Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
20 All go to one place; all came from the dust, and all return to the dust. Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.
21 Who knows whether the human spirit goes up, and whether the animal's spirit goes down to the earth? Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
22 So I saw nothing is better than a person rejoicing in their work, since that is their lot. For who can show them what comes after them? Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]