Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ecclesiastes 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Again I looked and saw all the oppression under the sun: the oppressed were in tears, with no one to comfort them; their oppressors held the power, and still no comforter. Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
2 So I declared the dead, who had already died, happier than the living, who are still alive. Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, ka ndị dị ndụ mma, bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a.
3 Better than both is the one not yet born, who hasn't seen the evil done under the sun. Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.
4 I saw all labor and skill come from one neighbor's envy of another. This too is fleeting, a chasing after wind. Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.
5 The fool folds his hands and ruins himself. Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.
6 Better one handful with tranquility than two handfuls with toil and a chasing after the wind. Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
7 Again I saw something fleeting under the sun: Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.
8 A man alone, no companion, no son or brother; his labor has no end, yet his eyes never fill with wealth. "For whom am I working," he asks, "denying myself good?" This too is a breath—a bad task. Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ, o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne. Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ, ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,” “nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?” Ihe nke a enweghị isi, ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.
9 Two are better than one, because they have a good return for their labor: Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
10 If one falls, the other lifts him up. But pity the one who falls alone, with no one to help him up. Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
11 Also, if two lie down together, they will keep warm. But how can one keep warm alone? Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
12 One alone can be overpowered; two can resist. A cord of three strands is not quickly broken. Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
13 Better a poor, wise youth than an old, foolish king who no longer knows to take warning. Ọ ka mma ịbụ nwantakịrị na onye ogbenye nwere nghọta karịa ịbụ agadi bụ eze ndị nzuzu, onye na-adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ ọbụla.
14 The youth may have come from prison to reign, or he may have been born poor within that same kingdom. Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
15 I saw all the living who move about under the sun following the youth, the king's successor. Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
16 Countless were all the people who came before him. Yet those who came later were not pleased with him. This too is fleeting, a chasing after wind. A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]