Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Job 17 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

1Mmụọ m tiwara etiwa,ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,ili na-echere ịnabata m.

2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.

3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?

4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.

5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,anya ụmụ ya ga-ada mba.

6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.

7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.

8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.

9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.

10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.

11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.Ma ọchịchọ nke obi m

12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.

13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,

14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’

15ebeekwa ka olileanya m dị?Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?

16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]