Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jeremiah 45 OICB

Side by side with the Father's Heart Bible™

Ozi e ziri Baruk

1Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk, 3Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’ 4Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile. 5Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]