Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

James 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My brothers and sisters, as believers in our glorious Lord Jesus Christ, do not show favoritism. Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu.
2 Say a man wearing a gold ring and fine clothes enters your assembly, and a poor man in shabby clothes enters too. Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha,
3 If you notice the well-dressed one and say, "Sit here, a good seat," but tell the poor man, "Stand over there," or "Sit on the floor by my feet," ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,”
4 haven't you played favorites among yourselves and become judges guided by evil motives? ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?
5 Listen, my beloved brothers and sisters: Hasn't our Father chosen the world's poor to be rich in faith, heirs of the kingdom promised to those who love him? Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?
6 But you disrespected the poor. Don't the rich oppress you and drag you into court? Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe?
7 Aren't they blaspheming the honorable name called over you? Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?
8 If you truly obey the royal law according to the Scripture, "Love your neighbor as yourself," you do well. Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.
9 But if you show favoritism, you are sinning, and the law convicts you as lawbreakers. Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.
10 Whoever keeps the whole law but stumbles at one point is guilty of breaking it all. Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara.
11 For our Father, who forbade adultery, also forbade murder. So if you avoid adultery yet commit murder, you're a lawbreaker. Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.
12 Speak and act as people who will be judged by the law of freedom. Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.
13 Judgment is merciless to one who showed no mercy; mercy triumphs over judgment. Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
14 What good is it, my brothers and sisters, if someone claims faith without works? Can that faith save him? Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya?
15 Suppose a brother or sister is poorly clothed and lacking daily food, Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị,
16 and one of you tells them, "Go in peace, stay warm and fed," but gives nothing for their bodily needs—what good is that? ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?
17 In the same way, faith by itself, if it is not accompanied by works, is dead. Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.
18 But someone will say, "You have faith, and I have works." Show me your faith without works, and I'll show you my faith from my works. Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ
19 You believe that our Father is one; you do well. Even the demons believe that—and shudder. I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja.
20 Do you want me to show you, you foolish person, that faith apart from works is useless? Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya?
21 Was not Abraham our father justified by works when he offered his son Isaac on the altar? Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?
22 You see that faith was working together with his works, and faith was completed by his works. Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke.
23 This fulfilled the Scripture: "Abraham believed our Father, and it was credited to him as righteousness"—he was called our Father's friend. Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke.
24 You see that a person is justified by works and not by faith alone. Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe.
25 Likewise, wasn't Rahab the prostitute also justified by works, welcoming the messengers and sending them out a different way? Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?
26 As the body without the spirit is dead, so also faith without works is dead. Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]