Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

James 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 My brothers and sisters, not many of you should become teachers, since we teachers face stricter judgment. Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike.
2 For we all stumble in many ways. Anyone who never stumbles in speech is a mature man, able to control his whole body too. Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka.
3 If we put bits in horses' mouths to make them obey us, we guide their whole bodies too. Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ.
4 Consider ships too: though large and driven by strong winds, a tiny rudder steers them wherever the pilot wants. Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.
5 So too the tongue is a small body part, yet boasts great things. See how small a fire sets ablaze a great forest! Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ.
6 The tongue is a fire, a world of wickedness placed among our body's parts. It stains the whole body, sets the whole course of life ablaze, and is itself set ablaze by hell. Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.
7 Every kind of beast, bird, reptile, and sea creature is tamed, and has been tamed, by humankind, Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri;
8 but no human being can tame the tongue. It is a restless evil, full of deadly poison. ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.
9 With it we bless our Father; with it we curse people made in the likeness of our Father. Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya.
10 From the same mouth come blessing and cursing. My brothers and sisters, this should not be. Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.
11 Does a spring pour out both fresh and bitter water from the same opening? Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?
12 Brothers and sisters, can a fig tree bear olives, or a vine figs? Neither can a salt spring yield fresh water. Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.
13 Who is wise and understanding among you? Let him show his deeds through good conduct, in wisdom's humility. Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.
14 But if bitter envy and selfish ambition fill your heart, don't boast or lie against the truth. Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu.
15 This is not the wisdom that comes down from above, but is earthly, unspiritual, demonic. Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ.
16 For where there is jealousy and selfish ambition, there will be disorder and every vile practice. Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị.
17 Wisdom from above: pure first, then peace-loving, gentle, reasonable, full of mercy and good fruit, unbiased, sincere. Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.
18 And the harvest of righteousness is sown in peace by those who make peace. Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]