Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

James 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Where do wars and fights among you come from? Isn't it your cravings warring inside you? Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?
2 You want and don't have—you kill. You crave and can't get it—you quarrel and fight. You don't have because you don't ask. Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.
3 You ask and do not receive, because you ask wrongly, to spend it on your own pleasures. Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.
4 You adulterous people! Don't you know friendship with the world is hostility toward our Father? Whoever chooses to be its friend becomes an enemy of our Father. Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
5 Or does Scripture speak for nothing, saying the spirit he placed in us longs jealously? Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”
6 But he gives more grace. That is why Scripture says, "Our Father opposes the proud but gives grace to the humble." Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
7 Submit yourselves, then, to our Father. Resist the devil, and he will flee from you. Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
8 Come close to our Father, and he will come close to you. Cleanse your hands, sinners; purify your hearts, double-minded. Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.
9 Grieve, mourn, and weep. Turn your laughter to mourning and your joy to gloom. Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.
10 Humble yourselves before our Father, and he will lift you up. Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.
11 Don't speak against each other, brothers and sisters. Whoever speaks against a brother, or judges him, speaks against the law and judges it. But if you judge the law, you're not keeping it—you're judging it. Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe.
12 Only one gives the law and judges—able to save or destroy. Who are you to judge your neighbor? Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe?
13 Come now, you who say, "Today or tomorrow we will go to this or that city, spend a year, trade, and profit." Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”
14 You don't know what tomorrow brings. What is your life? For you're a mist, visible briefly, then gone. Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.
15 Instead you ought to say, "If our Father wills, we will live and do this or that." Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”
16 As it is, you boast in your arrogance. All such boasting is evil. Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.
17 So whoever knows the good to do and fails to do it, sin is theirs. Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]