Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

James 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Come now, you who are rich, weep and wail over the miseries that are coming upon you. Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.
2 Your riches have rotted, and your clothes have become moth-eaten. Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.
3 Your gold and silver have rusted; their rust will witness against you and burn your flesh like fire. You piled up riches in the last days. Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.
4 Look: the wages you held back from the workers who mowed your fields cry out, and the harvesters' cries have reached the ears of the Father of heaven's armies. Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
5 You lived on earth in luxury and indulgence. You fattened your hearts in a day of slaughter. Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya.
6 You have condemned and murdered the righteous one, who does not resist you. Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu.
7 So be patient, brothers and sisters, until the Lord's coming. Think of the farmer: he waits patiently for the land's precious fruit, until it gets the early and late rains. Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.
8 You too must be patient. Strengthen your hearts, because the coming of the Lord is near. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
9 Don't grumble against each other, brothers and sisters, or you'll be judged. Look—the Judge stands at the doors. Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.
10 Brothers and sisters, take the prophets who spoke in the name of our Father as examples of suffering and patience. Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị.
11 See, we call those who endured blessed. You've heard of Job's endurance and seen what our Father brought about—our Father is rich in compassion and mercy. Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.
12 Above all, my brothers and sisters, do not swear—neither by heaven, nor earth, nor any other oath. Let your yes be yes and your no, no, so you won't fall under judgment. Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.
13 Is anyone among you suffering? Let them pray. Is anyone cheerful? Let them sing praises. Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.
14 Anyone sick among you? Have them call for the church elders, and have the elders pray over them, anointing them with oil in the name of the Lord. Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
15 The prayer of faith will save the sick person, and the Lord will raise him up. And if he has sinned, he will be forgiven. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.
16 So confess your sins to each other and pray for each other, that you may be healed. A righteous person's prayer is powerful and effective. Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.
17 Elijah was a man like us, and he prayed hard that it not rain; it did not rain on the land for three years and six months. Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii.
18 Then he prayed again, and the heavens gave rain, and the earth produced its fruit. Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.
19 My brothers and sisters, if anyone among you wanders from the truth and someone turns them back, Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,
20 know this: whoever turns a sinner from their wrong way saves that person's soul from death and covers a multitude of sins. chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]