Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Peter 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Peter, apostle of Jesus Christ, to the chosen exiles scattered through Pontus, Galatia, Cappadocia, Asia, and Bithynia. Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a.
2 Chosen by our Father's foreknowledge, made holy by the Holy Spirit, to obey Jesus Christ and be sprinkled with his blood: grace and peace multiplied to you. Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.
3 Blessed is our Father, and the Father of our Lord Jesus Christ: by his great mercy he gave us new birth into a living hope through Jesus Christ's resurrection from the dead, Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.
4 into an inheritance that can never perish, spoil, or fade, kept in heaven for you, Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.
5 protected through faith by our Father's power for the salvation ready to be revealed in the last time. Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge.
6 You rejoice greatly in this, though now, briefly, you may have had to be distressed by various trials. Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
7 These have come so that your faith—tested and found genuine, worth more than fire-refined gold that still gets destroyed—may bring praise, glory, and honor when Jesus Christ appears. Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.
8 Though you've never seen him, you love him; though you don't see him now, you trust him, rejoicing with joy beyond words and full of glory, Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.
9 for you are receiving the goal of your faith, the salvation of your souls. Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu.
10 Prophets who spoke of the grace meant for you investigated and searched carefully into this salvation, Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa
11 searching for the time and situation the Spirit of Christ in them pointed to, when he predicted Christ's sufferings and the glories after them. ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.
12 It was revealed to them: they served not themselves but you, when they spoke of these things now announced to you through those who preached the good news to you by the Holy Spirit sent from heaven. Even angels long to look into these things. E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a.
13 So, minds braced for action and fully sober, hope completely on the grace to be brought to you when Jesus Christ is revealed. Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.
14 As obedient children, don't let yourselves be shaped by the desires you once followed in your ignorance. Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
15 But just as the one who called you is holy, so be holy in all you do; Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.
16 for it is written: "Be holy, because I am holy." Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.”
17 Since you call on a Father who judges every deed without favoritism, spend your exile time here in reverent fear. Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a.
18 You know silver and gold—things that decay—didn't rescue you from the empty life passed down from your ancestors, Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka
19 but with Christ's precious blood, a lamb without defect or stain. kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.
20 Chosen before the world's foundation, revealed in these last times for your sake. A họpụtara ya tupu e kee ụwa. Kama, ọ bụ nʼọgwụgwụ oge ndị a ka e mere ka ọ pụta ìhè nʼihi unu.
21 Through him you believe in our Father, who raised him from the dead and glorified him, so your faith and hope are in our Father. Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.
22 Having purified your souls by obeying the truth for sincere love of the brothers, love each other deeply from a pure heart. Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu.
23 For you have been born again—not of perishable seed but imperishable—through the living, enduring word of our Father. Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.
24 For, "All people are like grass, and all their glory like the flowers of the field; the grass withers and the flowers fall, Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
25 but the word of our Father endures forever." And this is the word that was preached to you. ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]