Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Peter 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So put away all malice and all deceit and hypocrisy and envy and all slander. Ya mere, wezuganụ nʼibu iro nʼobi na aghụghọ niile unu, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, na ndị na-ekwutọ mmadụ ibe ha.
2 Like newborn babies, crave pure milk of the word, so you grow into salvation, Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu.
3 now that you have tasted that the Lord is good. Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma.
4 As you come to him, the living stone rejected by people but chosen, precious to our Father. Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya.
5 You too are being built, like living stones, into a spiritual house and a holy priesthood, offering spiritual sacrifices our Father accepts through Jesus Christ. Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.
6 Scripture says: "See, I set in Zion a chosen, precious cornerstone; whoever believes in him will never be put to shame." Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
7 This honor, then, is for you who believe. For those who don't, the stone the builders rejected has become the cornerstone, Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”
8 and a stumbling stone, a rock that trips them. They trip because they disobey the word—exactly what they were appointed for. Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.
9 But you are a chosen people, a royal priesthood, a holy nation, a people belonging to our Father, to proclaim the praises of the one who called you from darkness into his amazing light. Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
10 Once you were not a people, now you are our Father's people; once you had not received mercy, now you have received mercy. Nʼoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mbụ, unu amaghị ihe ọbụla banyere obi ebere ya, ma ugbu a, obi ebere ya erutela unu aka.
11 Dear friends, I urge you—foreigners and exiles—to avoid fleshly desires that war against your soul. Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.
12 Live good lives among the nations, so that when they slander you as wrongdoers, they may see your good deeds and glorify our Father on the day he visits us. Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa.
13 Submit to every human authority for the Lord's sake—whether the emperor, as supreme, Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,
14 or to governors, sent by the emperor to punish wrongdoers and praise those who do good. maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.
15 For this is our Father's will: that by doing good you silence the ignorant talk of foolish people. Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.
16 Live as free people—not using freedom to cover evil—but as servants of our Father. Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
17 Respect everyone, love the family of believers, fear our Father, honor the emperor. Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze.
18 Servants, submit to your masters with full respect—not only the good and gentle, but also the harsh. Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.
19 For it is commendable if someone bears up under the pain of unjust suffering, mindful of our Father. Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.
20 What credit is it to endure a beating for doing wrong? But enduring suffering for doing good—this is commendable before our Father. Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.
21 You were called to this, since Christ suffered for you too, leaving an example for you to follow in his steps. Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.
22 "He committed no sin, and no deceit was found in his mouth." “O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”
23 When they hurled their insults at him, he did not retaliate; when he suffered, he made no threats, but entrusted himself to the one who judges justly. O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
24 He himself bore our sins in his body on the tree, so that we might die to sin and live for righteousness; by his wounds you have been healed. Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.
25 For you were straying like sheep, but now have returned to the Shepherd and Guardian of your souls. Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]