Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Peter 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Likewise, wives, submit to your own husbands, so that even if some disobey the word, they may be won without a word by their wives' conduct, Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla,
2 seeing your pure, reverent conduct. mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
3 Do not let your beauty be the outward kind—braided hair, gold jewelry, fine clothing. Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
4 But let it be the hidden person of the heart, the undying beauty of a gentle, quiet spirit, precious in our Father's sight. Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
5 For this is how the holy women of old who hoped in our Father adorned themselves, submitting to their own husbands, Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
6 as Sarah obeyed Abraham, calling him lord. And you have become her children if you do good, fearing no terror. Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.
7 Husbands, similarly, live with your wives with understanding, honoring each as the weaker vessel and as coheirs of the grace of life, so your prayers aren't hindered. Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
8 Finally, all of you, be of one mind, sympathetic, loving one another as family, tenderhearted, and humble. Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
9 Do not repay evil for evil or insult for insult, but bless instead—you were called to this, so you may inherit blessing. Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
10 For, "Whoever desires to love life and to see good days, let him keep his tongue from evil and his lips from speaking deceit. Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
11 Let him turn away from evil and do good; let him seek peace and pursue it. Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.
12 For the eyes of our Lord are on the righteous, and his ears are open to their prayer, but the face of our Lord is against those who do evil." Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”
13 Now who is there to harm you if you are eager to do what is good? Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe?
14 But if you suffer for righteousness, you are blessed. Don't fear their fear, don't be shaken. Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”
15 Set Christ apart as Lord in your hearts. Always be ready to answer anyone who asks the reason for your hope, but with gentleness and respect. Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.
16 Keep a clear conscience, so that when you're slandered, those who insult your good conduct in Christ are shamed. Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.
17 Better to suffer for doing good, if that's our Father's will, than for doing evil. Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.
18 For Christ too suffered once for sins, the righteous for the unrighteous, to bring us to our Father—put to death in flesh, made alive in spirit, Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.
19 in which he also went and proclaimed to the spirits in prison, Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.
20 who disobeyed long ago, when our Father waited patiently in Noah's days as the ark was being built, in which a few—eight people—were brought safely through the water. Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ.
21 This corresponding baptism now saves you too—not removing body dirt, but appealing to our Father for a good conscience—through Jesus Christ's resurrection, Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,
22 who entered heaven and is at our Father's right hand, with angels, authorities, and powers subject to him. onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]