Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Peter 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So, since Christ suffered in the flesh, arm yourselves too with the same mindset: whoever suffers in the flesh is done with sin. Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie.
2 So you no longer spend your remaining time in the flesh for human cravings, but for the will of our Father. Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.
3 You've already spent enough time doing what those who don't know the Father want: living in sensuality, lust, drunkenness, wild parties, drinking bouts, and lawless idol worship. Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.
4 They're surprised you no longer run with them into the same flood of wild living, so they insult you for it. Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.
5 But they will answer to the one ready to judge the living and the dead. Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
6 This is why the gospel was preached even to those now dead: judged in the flesh as all people are, but they may live in the spirit as our Father does. Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ.
7 The end of all things is near. Therefore be clear-minded and self-controlled so that you can pray. Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.
8 Above all, keep loving one another deeply, because love covers a multitude of sins. Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
9 Show hospitality to one another without grumbling. Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.
10 Each of you, use whatever gift you've received to serve others, as good stewards of our Father's varied grace. Onye ọbụla nʼime unu dịka ndị ozi natara onyinye amara nke Chineke, jirinụ onyinye ọbụla unu natara na-ejeritara onwe unu ozi.
11 Whoever speaks should speak as one delivering the very words of our Father. Whoever serves should serve by the strength he supplies, so that in everything he may be glorified through Jesus Christ. To him belong the glory and the power forever and ever. Amen. Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
12 Dear friends, don't be surprised at the fiery trial testing you, as if something strange were happening to you. Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.
13 Instead, rejoice as much as you share Christ's suffering, so you may also rejoice with joy when his glory is revealed. Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
14 If insulted for Christ's name, you're blessed, for the Spirit of glory and of our Father rests on you. Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu.
15 None of you should suffer as a murderer, thief, criminal, or meddler in others' affairs. Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike.
16 But if you suffer as a Christian, don't be ashamed, but praise our Father that you bear that name. Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.
17 For it is time for judgment to begin with the household of our Father; if it starts with us, what awaits those who disobey the good news of our Father? Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke?
18 And, "If the righteous are barely saved, what will become of the ungodly and sinner?" Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?”
19 So then, those who suffer by our Father's will should entrust their souls to their faithful Creator, doing good. Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]