Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

1 Peter 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 I urge the elders among you, as fellow elder, witness of Christ's sufferings, and sharer in the glory about to be revealed: Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a,
2 Shepherd our Father's flock among you, watching over it—not forced but willing, as our Father wants; not for shameful profit but eager, na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi.
3 not lording it over those entrusted to you, but being examples to the flock. Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
4 And when the Chief Shepherd appears, you will receive the unfading crown of glory. Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
5 Likewise, younger ones, submit to elders. All of you, dress yourselves in humility toward each other, for our Father opposes the proud but gives grace to the humble. Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
6 So humble yourselves under our Father's mighty hand, that he may lift you up in the right time, Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
7 casting all your anxiety on our Father, because he cares for you. Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
8 Stay sober and watchful; your adversary the devil roams like a roaring lion, hunting someone to devour. Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
9 Resist him, standing firm in faith, knowing your fellow believers worldwide endure the same suffering. Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
10 And our Father of all grace, who called you to his eternal glory in Christ, will himself restore, support, strengthen, and ground you after brief suffering. Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.
11 To him be the dominion forever. Amen. Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
12 Through Silvanus, a faithful brother as I see him, I've written briefly—encouraging you and testifying that this is the true grace of our Father. Stand firm in it. Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.
13 She who is in Babylon, chosen together with you, sends you greetings, and so does Mark, my son. Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu.
14 Greet one another with a kiss of love. Peace to all of you who are in Christ. Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]