Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Peter 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Simon Peter, servant and apostle of Jesus Christ, to those given a faith as precious as ours through the righteousness of our God and Savior Jesus Christ: Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
2 May grace and peace be multiplied to you through knowing our Father and Jesus our Lord. Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
3 His divine power gave us all we need for life and devotion to God, through knowing him who called us by his glory and excellence. O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
4 Through these he gave us his precious and very great promises, so that through them you may share the divine nature, having escaped the world's corruption from evil desires. O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
5 So, making every effort, add goodness to your faith, and to goodness, knowledge; Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,
6 to knowledge, self-control; to self-control, endurance; to endurance, devotion to God, tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.
7 to devotion to God, brotherly affection; to brotherly affection, love. Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.
8 If you have these qualities, growing, they'll keep you from being useless or fruitless in knowing our Lord Jesus Christ. Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9 Whoever lacks these things is blind, shortsighted, forgetting he was cleansed from his past sins. Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.
10 So, brothers and sisters, strive to confirm your calling and election; do these things and you will never stumble. Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
11 This way you'll be richly given entrance into the eternal kingdom of our Lord and Savior Jesus Christ. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.
12 So I will always remind you of these things, though you know them and stand firm in the truth you now hold. Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.
13 I think it right to keep stirring you with reminders while I remain in this tent, Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.
14 since I know I'll soon set my tent aside, as our Lord Jesus Christ showed me. Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.
15 I will also strive so you can always recall these things after I depart. Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
16 For we didn't follow ingenious myths to tell you of our Lord Jesus Christ's power and coming—we were eyewitnesses of his majesty. Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
17 He received honor and glory from our Father when a voice came to him from the Majestic Glory: "This is my Son, the one I love; I delight in him." Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
18 We ourselves heard this voice come from heaven, for we were with him on the holy mountain. Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
19 We also have the prophetic word made more certain—you do well to attend to it, like a lamp shining in a dark place, until day dawns and the morning star rises in your hearts. Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
20 Above all, you must understand that no prophecy of Scripture comes from one's own interpretation. Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
21 No prophecy ever came by human will, but men spoke from our Father, carried along by the Holy Spirit. Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]