Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

James 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 James, a servant of our Father and the Lord Jesus Christ, to the twelve tribes scattered among the nations: greetings. Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ!
2 Consider it pure joy, my brothers and sisters, whenever you face trials of many kinds, Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.
3 because you know that the testing of your faith produces perseverance. Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.
4 Let perseverance finish its work so that you may be mature and complete, lacking nothing. Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.
5 If any of you lacks wisdom, ask our Father, who gives freely to all without criticizing, and it will be given you. Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
6 Ask in faith, without doubting, for the doubter is like a sea wave, driven and tossed by the wind. Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.
7 That person should not expect to receive anything from our Father. Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla.
8 Such a person is double-minded and unstable in all their ways. Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme.
9 Let the believer in humble circumstances take pride in their high position, Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu.
10 but let the rich boast in their low state, since they'll pass like a wildflower. Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi.
11 The sun rises with scorching heat and withers the grass. Its flower falls; its beauty vanishes. So the rich fade away amid their pursuits. Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.
12 Blessed is the one who endures trial, because once tested they'll receive the crown of life our Father promised to those who love him. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
13 When tempted, no one should say, "Our Father is tempting me." Evil can't tempt our Father, and he tempts no one. Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.
14 But each person is tempted, dragged away and lured by their own evil desire. Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.
15 Then desire conceives and gives birth to sin; sin, full-grown, gives birth to death. Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
16 Don't be deceived, my dear brothers and sisters. Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.
17 Every good and perfect gift is from above, coming down from the Father of lights, who never changes or casts a shifting shadow. Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
18 By his choice, he gave us birth through the word of truth, so we'd be a kind of firstfruits of his creation. Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
19 Know this, my dear brothers and sisters: everyone should be quick to listen, slow to speak, slow to anger, Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
20 because human anger does not produce the righteousness of our Father. Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
21 So strip off all moral filth and excess evil; humbly receive the word planted in you, able to save your souls. Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.
22 Do not merely listen to the word, and so deceive yourselves. Do what it says. Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
23 Anyone who hears the word but doesn't act on it is like one who looks at his natural face in a mirror, Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo.
24 and, after looking at himself, goes away and immediately forgets what he looks like. O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.
25 But whoever peers into the perfect law of freedom, continuing in it—not a forgetful hearer but a doer who acts—will be blessed in his doing. Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.
26 If anyone thinks himself religious but doesn't control his tongue, he deceives his own heart—his religion is worthless. Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.
27 Pure and spotless religion before our Father is this: caring for orphans and widows in their distress, and keeping oneself unstained from the world. Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]