Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So, holy brothers sharing a heavenly call, consider Jesus, the apostle and high priest we confess. Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
2 He was faithful to the one who appointed him, as Moses also was in all our Father's house. O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke.
3 Jesus deserves far more glory than Moses, as a house's builder deserves more honor than the house itself. Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
4 For every house is built by someone, but the builder of all things is our Father. Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
5 Moses was faithful in all our Father's house, a servant testifying to what would be spoken later. Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.
6 But Christ, as son, is faithful over his house. And we are his house—if we hold firm the confidence and hope we boast in. Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
7 So, as the Holy Spirit says: "Today, if you hear his voice, Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
8 do not harden your hearts as you did in the rebellion, on the day of testing in the wilderness, unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
9 where your ancestors put me to the test and saw my works for forty years. ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
10 That is why I was angry with that generation, and I said, 'Their hearts are always going astray, and they have not known my ways.' Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11 So I swore in my anger, 'They will never enter my rest.'" Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
12 Brothers, watch that none of you has an evil, unbelieving heart that deserts the living Father. Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.
13 But encourage each other daily, while it is called "today," so none of you becomes hardened by sin's deceit. Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.
14 For we have become sharers in Christ, if we truly keep our first confidence firm to the end. Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
15 As it is said: "Today, if you hear his voice, do not harden your hearts as when you rebelled." Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
16 Who heard and rebelled? Wasn't it all who left Egypt through Moses? Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?
17 With whom was he angry forty years? Was it not with those who sinned, whose bodies fell in the wilderness? Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
18 Who did he swear would never enter his rest, except those who disobeyed? Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi?
19 So we see they couldn't enter because of lack of faith. Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]