Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Since the promise to enter his rest still stands, let us be careful that none of you seems to have missed it. Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.
2 We too had good news preached to us, as they did. But the message heard didn't benefit them, since they didn't combine it with faith, as those who listened did. Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
3 We who believed enter that rest, as he said: "In my wrath I swore, they will never enter my rest." Yet his works were finished since the foundation of the world. Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.
4 For somewhere he says of the seventh day: "And our Father rested on the seventh day from all his works." Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”
5 And again in the same passage he says, "They will never enter my rest." Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”
6 Since it remains that some enter it, and those first given the good news failed to enter through their disobedience, Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.
7 so again he sets a day, "Today," speaking through David much later, as already said: "Today, if you hear his voice, do not harden your hearts." O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.”
8 For if Joshua had given them rest, our Father would not have spoken later about another day. Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.
9 So then, there remains a Sabbath rest for the people of our Father. Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.
10 Whoever has entered our Father's rest has also rested from his works, as our Father did from his own. Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.
11 So let's strive to enter that rest, so no one falls by the same pattern of disobedience. Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.
12 For the word of our Father is alive and active, sharper than any two-edged sword, piercing to divide soul and spirit, joints and marrow, discerning the heart's thoughts and intentions. Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
13 No creature is hidden from his sight; all lies naked and exposed to the eyes of the one we must answer to. Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
14 So since we have a great high priest who has passed through the heavens—Jesus, Son of our Father—let's hold firmly to the faith we profess. Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.
15 We have no high priest unable to sympathize with our weaknesses, but one tested in every way as we are, yet without sin. Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.
16 Let us then approach the throne of grace boldly, so we may receive mercy and find grace to help us in time of need. Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]