Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Every high priest taken from among men is appointed for men in matters relating to our Father, to offer gifts and sacrifices for sins. A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche.
2 He can deal gently with the ignorant and straying, since he himself also is subject to weakness. Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume.
3 Because of this weakness, he must offer sacrifices for sins—for the people as much as for himself. Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ.
4 No one takes this honor for himself, but only when called by our Father, as Aaron was. O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.
5 So also Christ did not glorify himself to become high priest, but the one who said to him: "You are my Son; today I have fathered you." Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”
6 Just as he also says elsewhere, "You are a priest forever, after the order of Melchizedek." Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.”
7 During his earthly life, Jesus offered prayers and pleas—with loud cries and tears—to the one able to save him from death, and was heard for his godly fear. Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya.
8 Although he was a Son, he learned obedience from what he suffered. Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara.
9 And having been made perfect, he became the source of eternal salvation to all who obey him, Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi.
10 having been appointed by our Father as a high priest after the order of Melchizedek. Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
11 We have much to say about this, hard to explain, since your hearing has grown dull. Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ.
12 For though you should be teachers by now, you need someone to teach you the basics of our Father's word again. You've come to need milk, not solid food. Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.
13 Everyone living on milk lacks skill in the word of righteousness, since he's an infant. Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume.
14 But solid food is for the mature, whose senses are trained by practice to distinguish good from evil. Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]