Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So we must pay closer attention to what we've heard, or we may drift away. Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
2 For if the word spoken through angels held firm, and every wrongdoing and disobedience got just payment, Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
3 how will we escape if we neglect so great a salvation? First announced by the Lord, it was confirmed to us by those who heard him, Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
4 while our Father also testified with them through signs, wonders, various miracles, and distributions of the Holy Spirit, according to his will. Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.
5 For it was not to angels that our Father subjected the coming world we're speaking of. Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
6 Someone has testified somewhere, "What is man, that you are mindful of him, or the son of man, that you care for him? Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
7 You made him for a little while lower than the angels; you crowned him with glory and honor, Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
8 putting everything in subjection under his feet." Now in subjecting everything to him, our Father left nothing outside his control. At present, however, we do not yet see everything subjected to Christ. dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
9 But we see Jesus, made lower than the angels for a little while, now crowned with glory and honor because he suffered death, so that by our Father's grace he might taste death for everyone. Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
10 It was fitting that our Father, for whom and through whom all things exist, should perfect the pioneer of their salvation through suffering, bringing many sons to glory. Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
11 The one who makes holy and those made holy all come from one Father. That's why he isn't ashamed to call them brothers and sisters, Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
12 saying, "I will proclaim your name to my brothers and sisters; I will sing your praise amid the assembly." Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
13 And again, "I will trust in him." And again, "Here am I, and the children our Father gave me." Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”
14 Since the children share flesh and blood, he too shared them, so that through death he might destroy the one holding the power of death—the devil, Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.
15 and free all those who, through fear of death, were enslaved their whole lives. Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
16 For surely it is not angels he helps, but the descendants of Abraham. Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
17 So he had to become like his brothers and sisters in every way, to be a merciful and faithful high priest serving our Father, clearing away the people's sins. Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
18 Since he himself suffered when tempted, he can help those being tempted. Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]