Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Hebrews 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Long ago, in many times and many ways, our Heavenly Father spoke to our ancestors through the prophets. Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
2 But in these final days he spoke to us by his Son, whom he appointed heir of all things and through whom he made the universe. Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya.
3 The Son is the brightness of our Father's glory, the exact image of his being, sustaining all things by his powerful word. After purifying sins, he sat down at the right hand of the Majesty on high. Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
4 He became as much greater than angels as his inherited name is greater than theirs. Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
5 For to which of the angels did our Father ever say, "You are my Son; today I have become your Father"? Or again, "I will be his Father, and he will be my Son"? Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
6 And again, when he brings the firstborn into the world, he says, "Let all my angels worship him. Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
7 Of the angels he says, "He makes his angels winds, and his servants flames of fire." O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
8 But about the Son he says, "Your throne, O God, is forever and ever, and the scepter of righteousness is the scepter of your kingdom. Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.
9 You have loved righteousness and hated wickedness; therefore our Father, your Father, has anointed you with the oil of gladness above your companions." Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
10 And, "In the beginning, Lord, you laid the foundations of the earth, and the heavens are the work of your hands. Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
11 They will perish, but you remain; they will all wear out like a garment. Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
12 You will roll them up like a robe; like a garment they will be changed. But you are the same, and your years will never end." Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
13 But to which of the angels did our Father ever say, "Sit at my right hand until I make your enemies a footstool for your feet"?" O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
14 Aren't all angels ministering spirits, sent to serve those about to inherit salvation? Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]