Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Philemon 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul, a prisoner of Christ Jesus, and Timothy our brother, to Philemon, our dear friend and co-worker, Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn.
2 and to our sister Apphia, our fellow soldier Archippus, and the church that meets in your house: Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a.
3 Grace and peace to you from our Father and the Lord Jesus Christ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu.
4 I always thank my Father as I remember you in my prayers, Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe.
5 because I hear of your love and faith in the Lord Jesus and for all his holy people. Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile.
6 I pray your shared faith becomes effective as you come to understand every good thing we have in Christ. Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst.
7 Your love has brought me great joy and comfort, brother, since you've refreshed the hearts of his holy people. Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
8 Therefore, although in Christ I am bold enough to command you to do what is right, Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a.
9 instead, for love's sake I appeal—I, Paul, an old man, now also a prisoner of Christ Jesus. Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a.
10 I appeal to you for my child Onesimus, whose father I became while I was in chains. Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ.
11 He was once useless to you, but now is useful to you and me. Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru.
12 I am sending him back to you—and in doing so I am sending my very heart. Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị.
13 I wanted to keep him with me, to serve me on your behalf while I'm in chains for the gospel. Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma.
14 But I wanted to do nothing without your consent, so your good deed would not be forced, but voluntary. Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.
15 Perhaps this is why he was separated from you briefly, so you'd have him back forever. Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi.
16 No longer as a slave, but more than a slave—a beloved brother, especially to me, but even more to you, both in the flesh and in the Lord. Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị.
17 So if you consider me a partner, welcome him as you would welcome me. Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
18 If he wronged you at all, or owes anything, put it on my account. Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.
19 I, Paul, write this with my own hand: I'll repay it—not to mention you owe me yourself as well. Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị.
20 Yes, brother, do me this favor in the Lord—refresh my heart in Christ. Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst.
21 Trusting you'll obey, I write to you, knowing you'll do even more than I ask. Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ.
22 Also prepare a guest room for me—I hope through your prayers to be graciously given back to you. Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu.
23 Epaphras, my fellow prisoner in Christ Jesus, sends you greetings, Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị.
24 and so do Mark, Aristarchus, Demas, and Luke, my fellow workers. Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.
25 The grace of the Lord Jesus Christ be with your spirit. Amen. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]