Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Titus 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Remind them to submit to rulers and authorities, obey, and be ready for every good work, Chetara ndị nke gị ka ha doo onwe ha nʼokpuru ndịisi na ndị ọchịchị, ka ha rubere ha isi, dịkwa njikere ịrụ ọrụ ọma ọbụla.
2 to slander no one, avoid quarreling, be gentle, and show complete consideration to everyone. Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.
3 We too were once foolish, disobedient, deceived, enslaved to various desires and pleasures, living in malice and envy, hated, hating one another. Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.
4 But when the goodness and loving kindness of our Father, our Savior, appeared, Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe,
5 he saved us—not for righteous deeds we did, but by his mercy, through washing of new birth and renewal by the Holy Spirit, ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ,
6 whom he poured out on us richly through Jesus Christ our Savior, onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst,
7 so that, justified by his grace, we might become heirs in the hope of eternal life. ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi.
8 This word is trustworthy: I want you to insist on these things, so that those who trust our Father take care to devote themselves to good works. These things are good and helpful to everyone. Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-amasị m ma i kwusie ihe ndị a ike, ka ndị kweere na Chineke, lezie anya nʼịrụ ezi ọrụ. Ihe ndị a dị mma na-abakwara mmadụ uru.
9 But avoid foolish controversies, genealogies, disputes, and quarrels about the law, for they are useless and worthless. Ma zere ịrụ ụka nzuzu na ịgụ agbụrụ ọmụmụ, esemokwu niile, na ọgụ niile ndị mmadụ na-alụ banyere iwu. Ihe ndị a niile abaghị uru ọbụla, ha bụ ihe efu.
10 Warn a divisive person once, then a second time; after that, have nothing more to do with him, Gbasara onye na-akpa oke, ị dụchaa ya ọdụ ihe dịka otu ugboro maọbụ abụọ, leghara ya anya.
11 knowing that such a person is warped and sinful; he stands self-condemned. Ebe ị ma na onye dị otu a bụ onye ndahie na onye ajọọ omume, o jirila aka ya maa onwe ya ikpe.
12 When I send Artemas or Tychicus to you, do your best to come to me at Nicopolis, since I've decided to winter there. Ana m akwado izitere gị Atemas maọbụ Taịkikọs. Gbalịa bịakwute m na Nikopolis, maka nʼebe ahụ ka m kpebiri ịnọ nʼoge oyi.
13 Quickly send Zenas the lawyer and Apollos on their way; see they lack nothing. Gbaa mbọ zipụ Zenas bụ onye ọkaikpe, na Apọlọs, ngwangwa nʼije ha. Hụkwa na ha ji ihe niile dị ha mkpa.
14 Let our people also learn to devote themselves to good works, meeting urgent needs, and not be unproductive. Nʼihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị niile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ.
15 All those with me greet you. Greet those who love us in faith. Grace be with all of you. Ndị niile mụ na ha nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwara anyị ndị niile hụrụ anyị nʼanya nʼime okwukwe. Ka amara dịnyere unu niile.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]