Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Titus 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But as for you, speak what is fitting for sound teaching. Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.
2 Older men are to be sober-minded, dignified, self-controlled, sound in faith, love, and patient endurance. Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi.
3 Older women likewise: deeply respectful in behavior, not slanderers, not enslaved to much wine, but teachers of what is good, Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma.
4 so that they may train the young women to love their husbands and to love their children, Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya.
5 self-controlled, pure, working at home, good, submissive to their own husbands, so our Father's word isn't insulted. Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.
6 Likewise urge the younger men to be self-controlled. Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha.
7 In everything be an example of good works, with integrity and dignity in your teaching, Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
8 healthy words beyond criticism, so any opponent is ashamed, with nothing bad to say about us. Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
9 Slaves must submit to their own masters in everything, pleasing them, not talking back, Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu,
10 not stealing, but showing complete, good faithfulness, so they adorn, in everything, the teaching of our Father, our Savior. ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
11 For the grace of our Father has appeared, bringing salvation to all people, Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè.
12 teaching us to reject wickedness and worldly desires, and live self-controlled, upright, and godly lives in this present age, Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a.
13 waiting for the blessed hope and glorious appearing of our great God and Savior, Jesus Christ, Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.
14 who gave himself for us to redeem us from all lawlessness and purify for himself a people of his own, eager for good works. Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
15 Declare these things; encourage and rebuke with all authority. Let no one disregard you. Na-akụzi ihe ndị a, werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ site nʼikike niile i nwere. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nʼihu. Ka mmadụ ọbụla ghara ilelị gị anya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]