Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Our Father said to Moses, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 "send men to scout the land of Canaan, which I'm giving Israel's people. Send one man per ancestral tribe, each a leader among them." “Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”
3 So Moses sent them from the wilderness of Paran at our Father's command; all were leaders of Israel's people. Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.
4 These were their names: from the tribe of Reuben, Shammua the son of Zaccur; Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,
5 from the tribe of Simeon, Shaphat the son of Hori; Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.
6 from the tribe of Judah, Caleb the son of Jephunneh; Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.
7 from the tribe of Issachar, Igal the son of Joseph; Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.
8 from the tribe of Ephraim, Hoshea the son of Nun; Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem
9 from the tribe of Benjamin, Palti the son of Raphu; Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.
10 from the tribe of Zebulun, Gaddiel the son of Sodi; Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.
11 from the tribe of Joseph (that is, from the tribe of Manasseh), Gaddi the son of Susi; Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).
12 from the tribe of Dan, Ammiel the son of Gemalli; Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.
13 from the tribe of Asher, Sethur the son of Michael; Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.
14 from the tribe of Naphtali, Nahbi the son of Vophsi; Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.
15 from the tribe of Gad, Geuel the son of Machi. Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.
16 These are the names of the men Moses sent to scout the land. Moses named Hoshea son of Nun, Joshua. Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
17 Moses sent them to scout the land of Canaan and said to them, "Go up this way into the Negev, go up into the hill country, Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.
18 and see what the land is like, and whether the people living there are strong or weak, few or many, Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.
19 and whether the towns they live in are open camps or fortified, and whether the land is good or bad, Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.
20 and whether the land is rich or poor, and whether it has trees or not. Be brave, and bring back fruit from the land." It was the season of the first ripe grapes. Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)
21 So they went up and explored the land from the wilderness of Zin to Rehob, near Lebo-hamath. Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.
22 They went up through the Negev to Hebron, where Ahiman, Sheshai, and Talmai, Anak's descendants, lived. Hebron was built seven years before Zoan in Egypt. Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)
23 They reached the Valley of Eshcol and cut a branch with one cluster of grapes, carried on a pole between two men; they also brought pomegranates and figs. Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
24 That place was named Valley of Eshcol, since the Israelites cut a cluster of grapes there. A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.
25 At the end of forty days they returned from exploring the land. Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
26 They came to Moses, Aaron, and the whole community of Israel in the wilderness of Paran, at Kadesh, reported back to them and the whole community, and showed them the land's fruit. Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
27 They told him, "We went to the land you sent us to. It truly flows with milk and honey; here is its fruit. Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.
28 Yet the people in the land are strong, the cities fortified and very large—we even saw Anak's descendants there. Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ.
29 Amalekites live in the Negev. Hittites, Jebusites, and Amorites live in the hills. Canaanites live along the sea and beside the Jordan." Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”
30 Caleb silenced the people before Moses and said, "Let's go up now and possess it—we can certainly overcome it." Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
31 But the men who went up with him said, "We can't go up against the people, for they are stronger than we are." Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.”
32 So they gave Israel a bad report of the land they had explored, saying, "The land we crossed to explore devours its inhabitants, and everyone we saw there is of great size. Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa
33 There we saw the Nephilim—Anak's descendants come from the Nephilim. We seemed like grasshoppers to ourselves, and so we seemed to them." Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]