Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Miriam and Aaron spoke against Moses over the Cushite woman he had married—he had married a Cushite woman. Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
2 They said, "Has our Father spoken only through Moses? Hasn't he also spoken through us?" And our Father heard it. Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
3 Now the man Moses was very humble, more than anyone else on the face of the earth. (Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)
4 Suddenly our Father told Moses, Aaron, and Miriam, "Come out, you three, to the tent of meeting." The three went out. Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.
5 Then our Father came down in a pillar of cloud, stood at the tent entrance, called Aaron and Miriam, and both came forward. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.
6 He said, "Hear my words: if a prophet is among you, I, your Father, reveal myself to him in a vision, speak to him in a dream. Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
7 Not so with my servant Moses; he is faithful in all my house. Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
8 With him I speak mouth to mouth, clearly and not in riddles, and he sees the form of our Father. Why then were you not afraid to speak against my servant Moses?" Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9 So the anger of our Father burned against them, and he departed. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
10 When the cloud lifted from over the tent, there was Miriam—diseased, white as snow. Aaron turned to Miriam, and there—diseased. Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
11 Aaron told Moses, "Please, my lord, don't hold against us the sin of our foolishness and wrongdoing. ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
12 Don't let her be like a stillborn, its flesh half-consumed leaving its mother's womb." Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
13 So Moses cried out to our Father, "Please, my Father, please heal her!" Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
14 But our Father told Moses, "If her father had only spit in her face, wouldn't she be ashamed seven days? Shut her outside the camp seven days; then bring her back." Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
15 Miriam was shut outside the camp seven days; the people did not move until she was brought back. Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
16 After that the people set out from Hazeroth and camped in the Wilderness of Paran. Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]