Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Numbers 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then the whole congregation raised their voices and cried out, and the people wept that night. Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile.
2 All the Israelites complained against Moses and Aaron; the whole community said to them, "If only we had died in the land of Egypt, or if only we had died in this wilderness! Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a.
3 Why is our Father bringing us to this land to fall by the sword? Our wives and children will be plunder. Wouldn't it be better to return to Egypt?" Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”
4 And they said to one another, "Let us appoint a leader and return to Egypt." Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”
5 Then Moses and Aaron fell facedown before the whole assembly of Israel. Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
6 Joshua son of Nun and Caleb son of Jephunneh, among those who scouted the land, tore their clothes. Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.
7 They told the whole Israelite community, "The land we passed through and explored is exceedingly good. Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma.
8 If our Father delights in us, he'll bring us into this land and give it to us, a land flowing with milk and honey. Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
9 Only don't rebel against our Father, and don't fear the people of the land—they are food for us. Their protection is gone; our Father is with us. Don't fear them." Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”
10 The whole community called for stoning Joshua and Caleb. Then our Father's glory appeared at the tent of meeting to all Israel's people. Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile.
11 And our Father said to Moses, "How long will this people despise me? And how long will they not believe in me, despite all the signs I've done among them? Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.
12 I will strike them with the plague and disinherit them, then make you a nation greater and stronger than they." Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”
13 But Moses said to our Father, "The Egyptians will hear of it, for you brought this people up from among them by your might, Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.
14 and they will tell the residents of this land, who have heard that you, our Father, are among this people, that you, our Father, are seen face to face, that your cloud stands over them, and you go before them in a pillar of cloud by day and a pillar of fire by night. Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị.
15 If you kill this people all at once, the nations who heard your fame will say, Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,
16 'Because God couldn't bring this people into the land he swore to them, he slaughtered them in the wilderness.' ‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’
17 And now, please, let the power of the Sovereign Father be great, as you have spoken, saying, “Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.
18 'Our Father is slow to anger, overflowing in covenant love, forgiving guilt and wrongdoing—yet he will by no means clear the guilty, bringing the fathers' sin on children to the third and fourth generation.' Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.
19 Please pardon this people's guilt according to the greatness of your covenant love, just as you've forgiven them from Egypt until now." Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”
20 Then our Father said, "I have pardoned, according to your word. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.
21 "But truly, as I live, and as all the earth will be filled with my glory, Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.
22 surely all the men who saw my glory and the signs I did in Egypt and the wilderness, yet tested me ten times and did not listen to my voice, Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,
23 shall not see the land I swore to their fathers. None who despised me will see it. o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.
24 But my servant Caleb has a different spirit and has followed me fully—I will bring him into the land he entered, and his descendants will possess it. Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya.
25 The Amalekites and the Canaanites live in the valleys. Tomorrow, turn and head into the wilderness toward the Red Sea." Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.”
26 And our Father spoke to Moses and Aaron, saying, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
27 "How long will this evil congregation grumble against me? I have heard the Israelites' grumbling against me. “Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a.
28 Tell them, 'As I live, declares our Father, I will do to you exactly what I heard you say: Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m.
29 'Your corpses will fall in this wilderness—all of you counted, your whole number, twenty years old and up, who grumbled against me. Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m.
30 None of you will enter the land I swore to settle you in, except Caleb son of Jephunneh and Joshua son of Nun. O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.
31 But your little ones, whom you said would become plunder, I will bring in; they will know the land you rejected. Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya.
32 But as for you, you will fall dead in this wilderness. Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a.
33 Your children will be shepherds in the wilderness forty years, bearing your unfaithfulness, until the last of your corpses lies in the wilderness. Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara.
34 As the days you scouted the land—forty days—a day for a year, you will carry your guilt forty years, and know my opposition to you. Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
35 I, your Father, have spoken: surely I will do this to this whole evil assembly gathered against me—they will end in this wilderness, and die there.'" Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”
36 The men Moses sent to scout the land returned, making the whole community grumble against Moses with a bad report about it. Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara.
37 The men who brought up a bad report of the land died by plague before our Father. Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.
38 But Joshua son of Nun and Caleb son of Jephunneh survived, of those men who went to explore the land. Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.
39 When Moses told these words to all the children of Israel, the people mourned greatly. Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.
40 They got up early in the morning and went up to the hilltop, saying, "Here we are. We will go up to the place our Father promised, for we have sinned." Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”
41 But Moses said, "Why now are you disobeying our Father's command? It won't succeed. Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.
42 Do not go up, for our Father is not among you, or you'll be struck down before your enemies. Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.
43 For the Amalekites and Canaanites are there before you; you'll fall by the sword. Since you've turned back from following our Father, he won't be with you." Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”
44 But they dared to climb to the hill country's crest, though the ark of the covenant of our Father and Moses did not leave the camp. Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ.
45 Then the Amalekites and the Canaanites living in that hill country came down, struck them, and crushed them as far as Hormah. Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]