Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lamentations 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 How the Sovereign Father in his anger has shrouded daughter Zion in a cloud! He has hurled down from heaven to earth the splendor of Israel; he has not remembered his footstool in the day of his anger. Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya.
2 The Sovereign Father has swallowed up without mercy all the dwellings of Jacob; in his wrath he has torn down the strongholds of daughter Judah. He has brought down to the ground in dishonor her kingdom and its rulers. Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. O sitela nʼoke iwe ya dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ.
3 In fierce anger he has stripped Israel of all her strength; he has withdrawn his right hand and left them exposed to the enemy. He has burned in Jacob like a flaming fire that consumes on every side. O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.
4 He has bent his bow like an enemy, his right hand poised like a foe; and he has killed all who were lovely to see. In the tent of daughter Zion he has poured out his fury like fire. O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, dịka onye iro. Dịka onye iro kwa o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, nʼelu ụlọ ada Zayọn.
5 The Sovereign Father has become like an enemy; he has swallowed up Israel. He has swallowed up all her palaces and laid in ruins her strongholds, and he has heaped mourning and lamentation on daughter Judah. Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.
6 He has stripped his shelter like a garden, he has ruined his appointed place. Our Father has made Zion forget appointed feast and sabbath, and in his fierce anger he has spurned king and priest. O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.
7 The Sovereign Father has rejected his altar, disowned his sanctuary; he has handed over to the enemy the walls of her palaces. They raised a shout in the house of our Father as on a day of festival. Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.
8 Our Father determined to lay in ruins the wall of daughter Zion. He stretched out the measuring line; he did not hold back his hand from destroying. He made rampart and wall lament; together they fell to ruin. Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.
9 Her gates have sunk into the ground; he has ruined and broken her bars. Her king and her princes are among the nations; the law is no more, and her prophets find no vision from our Father. Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
10 The elders of daughter Zion sit on the ground in silence; they have thrown dust on their heads and put on mourning clothes. The young women of Jerusalem have bowed their heads to the ground. Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala.
11 My eyes are worn out from weeping; my stomach churns; my heart is poured out on the ground because of the destruction of the daughter of my people, as children and infants faint in the streets of the city. Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.
12 They cry to their mothers, "Where is bread and wine?" as they faint like the wounded in the streets of the city, as their life is poured out in their mothers' arms. Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?” Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha.
13 What can I say for you, to what can I compare you, daughter Jerusalem? What can I liken to you, that I may comfort you, virgin daughter Zion? For your ruin is vast as the sea; who can heal you? Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị?
14 Your prophets have seen for you false and deceptive visions; they did not expose your guilt to restore your fortunes, but have seen for you oracles that are false and misleading. Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie.
15 All who pass by clap their hands at you; they hiss and shake their heads at daughter Jerusalem: "Is this the city that was called the perfection of beauty, the joy of all the earth?" Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?”
16 All your enemies open their mouths against you; they hiss and gnash their teeth and cry, "We have swallowed her! This is the day we longed for; we have found it, we have seen it!" Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.”
17 Our Father has done what he purposed; he has carried out his word which he commanded long ago. He has torn down without pity; he has let the enemy gloat over you and raised up the power of your foes. Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.
18 The people's heart cried out to the Sovereign Father. Wall of daughter Zion, let tears stream down like a torrent day and night! Give yourself no rest, your eyes no relief. Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.
19 Arise, cry out in the night at the start of each night watch! Pour out your heart like water before the Sovereign Father! Lift your hands to him for the lives of your children, who faint from hunger at every street corner. Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
20 Look, our Father, and consider: whom have you ever treated like this? Should women eat their offspring, the children they have cradled? Should priest and prophet be killed in the sanctuary of the Sovereign Father? “Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
21 Young and old lie on the ground in the streets; my young women and my young men have fallen by the sword. You have killed them in the day of your anger, slaughtering without pity. “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.
22 You summoned, as to a festival day, terrors on every side; and on the day of our Father's anger no one escaped or survived. My enemy has destroyed those I cradled and raised. “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]