Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lamentations 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 I am the man who has seen affliction under the rod of his wrath. Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
2 He has driven me away and made me walk in darkness without any light. O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
3 Surely against me he turns his hand again and again, all day long. Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
4 He has worn away my flesh and my skin; he has broken my bones. O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
5 He has besieged me and surrounded me with bitterness and hardship. O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
6 He has made me dwell in darkness like those long dead. O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
7 He has walled me in so I cannot escape; he has weighed down my chains. Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
8 Even when I call out and cry for help, he shuts out my prayer. Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
9 He has blocked my ways with cut stones; he has made my paths crooked. O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
10 He is a bear lying in wait for me, a lion in hiding. Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
11 He drove me off my path and tore me to pieces; he has made me desolate. o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12 He bent his bow and set me as the target for his arrow. Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
13 He drove the arrows of his quiver into my vitals. O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
14 I have become the laughingstock of all my people, their mocking song all day long. Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15 He has filled me with bitterness; he has sated me with bitterness. O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
16 He has made my teeth grind on gravel, and made me cower in the dust. O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17 My soul has lost all peace; I have forgotten what happiness is. Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18 So I say, "My endurance has perished, and so has my hope from our Father." Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
19 Remember my affliction and my wandering, the bitterness and the gall! Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
20 My soul continually remembers it and is bowed down within me. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
21 But this I call to mind, and therefore I have hope: Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
22 The covenant love of our Father never ceases; his mercies never come to an end; Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23 they are new every morning; great is your faithfulness. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24 "Our Father is all I need," says my soul, "therefore I will hope in him." Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
25 Our Father is good to those who wait for him, to the soul who seeks him. Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26 It is good to wait quietly for the salvation of our Father. Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27 It is good for a man to bear the yoke in his youth. Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
28 Let him sit alone in silence when it is laid on him; Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29 let him put his mouth in the dust—there may yet be hope; Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
30 let him give his cheek to the one who strikes, and be filled with insults. Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
31 For the Sovereign Father will not abandon forever. Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
32 Though he causes grief, he will have compassion according to the abundance of his covenant love; Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33 for he does not willingly afflict or grieve people. Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
34 To crush underfoot all the prisoners of the earth, Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
35 to deny a man justice in the sight of the Most High, ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
36 to deprive a man of justice in his case—the Sovereign Father does not approve. ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
37 Who has spoken and it came to pass, unless the Sovereign Father has commanded it? Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
38 Is it not from the mouth of the Most High that both calamity and good come? Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
39 Why should a living man complain about the punishment for his sins? Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
40 Let us examine and test our ways, and return to our Father! Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41 Let us lift up our hearts and our hands to our Father in heaven: Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42 "We have sinned and rebelled, and you have not forgiven. “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
43 You have wrapped yourself in anger and pursued us, killing without pity; “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44 you have wrapped yourself with a cloud so that no prayer can pass through. I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
45 You have made us scum and refuse among the peoples. I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
46 All our enemies open their mouths against us; “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
47 panic and pitfall have come upon us, devastation and destruction." Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
48 My eyes flow with streams of water over the destruction of my people. Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
49 My eyes will flow without ceasing, without respite, Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
50 until our Father looks down and sees from heaven. tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
51 My eyes bring grief to my soul at the fate of all the daughters of my city. Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
52 I have been hunted like a bird by those who were my enemies without cause; Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53 they flung me alive into a pit and cast stones on me; Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
54 water closed over my head; I said, "I am lost." Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
55 I called on your name, my Father, from the depths of the pit; Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
56 you heard my plea: "Do not turn a deaf ear to my cry for help!" Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
57 You came near on the day I called on you; you said, "Do not fear!" Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
58 You have taken up my cause, Sovereign Father; you have redeemed my life. Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
59 You have seen the wrong done to me, my Father; judge my cause. Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
60 You have seen all their vengeance, all their plots against me. Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
61 You have heard their taunts, my Father, all their plots against me, Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
62 the lips and thoughts of my assailants against me all day long. Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
63 Watch their every move; I am the object of their mocking song. Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
64 You will repay them, my Father, according to the work of their hands. Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
65 You will give them hardness of heart; your curse will be on them. Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
66 You will pursue them in anger and destroy them from under the heavens of our Father. Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]