Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lamentations 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 How the gold has grown dim, how the purest gold is changed! The sacred stones lie scattered at every street corner. Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.
2 The precious children of Zion, once worth their weight in fine gold, how they are now counted as clay pots, the work of a potter's hands! Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
3 Even jackals offer the breast and nurse their young, but the daughter of my people has turned cruel, like ostriches in the wilderness. Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.
4 The tongue of the nursing infant sticks to the roof of its mouth from thirst; the children beg for bread, but no one gives them a piece. Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
5 Those who once feasted on delicacies now lie desolate in the streets; those who grew up wearing fine purple now cling to ash heaps. Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
6 The guilt of the daughter of my people is greater than the sin of Sodom, which was overthrown in a moment, though no human hand was laid against her. Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
7 Her princes were purer than snow, whiter than milk; their bodies more rosy than coral, their form like sapphire. Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
8 Now their appearance is blacker than soot; they go unrecognized in the streets. Their skin has shriveled on their bones; it has dried up like wood. Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
9 Those slain by the sword were better off than those slain by hunger, who wasted away, pierced through with hunger for lack of food from the fields. Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
10 The hands of compassionate women boiled their own children; they became their food when the daughter of my people was destroyed. Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
11 Our Father gave full vent to his wrath; he poured out his burning anger and kindled a fire in Zion that consumed her foundations. Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.
12 The kings of the earth did not believe, nor did anyone living on earth, that an enemy or a foe could enter the gates of Jerusalem. Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
13 It was for the sins of her prophets and the crimes of her priests, who shed in her midst the blood of the righteous. Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
14 They wandered blind through the streets, defiled with blood, so that no one could touch their garments. Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
15 "Away! Unclean!" people cried at them. "Away! Away! Do not touch!" So they fled and wandered, and among the nations it was said, "They can stay here no longer." Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
16 Our Father's presence has scattered them; he will look on them no longer. No honor was shown to the priests, no favor to the elders. Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.
17 Our eyes grew weary watching in vain for help; from our watchtowers we watched for a nation that could not save. Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
18 They stalked our steps so we could not walk in our streets. Our end drew near, our days were numbered, for our end had come. Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.
19 Our pursuers were swifter than eagles in the sky; they chased us over the mountains and lay in wait for us in the wilderness. Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
20 Our very life-breath, our Father's anointed, was captured in their pits—the one of whom we said, "Under his shadow we will live among the nations." Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.
21 Rejoice and be glad, daughter of Edom, you who live in the land of Uz; but the cup of his anger will come to you as well—you will become drunk and strip yourself bare. Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
22 Your punishment is complete, daughter of Zion; he will not prolong your exile. But your guilt, daughter of Edom, he will punish; he will lay bare your sins. Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]