Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lamentations 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 How lonely sits the city that once was full of people! She has become like a widow, she who was great among the nations. She who was a princess among the provinces has become a forced laborer. Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu! Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ, bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile. Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị si ghọọ ohu.
2 Bitterly she weeps in the night, tears on her cheeks. Among all her lovers she has no one to comfort her; all her friends have betrayed her, they have become her enemies. Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.
3 Judah has gone into exile under affliction and harsh servitude; she lives among the nations but finds no resting place. All her pursuers have overtaken her in the midst of her distress. Juda ejeela biri nʼala ọzọ, mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. Nʼetiti nhụju anya ya ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.
4 The roads to Zion mourn, for no one comes to the appointed feasts. All her gates are desolate, her priests groan, her young women grieve, and she herself is in bitter anguish. Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
5 Her foes have become her masters, her enemies are at ease, for our Father has afflicted her because of her many rebellions. Her children have gone away, led captive before the enemy. Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
6 All her majesty has departed from the daughter of Zion. Her princes have become like deer that find no pasture; they flee without strength before their pursuers. Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
7 In the days of her affliction and wandering, Jerusalem remembers all the precious things that were hers from days of old. When her people fell into the hands of the enemy, with no one to help her, the enemies looked on and mocked her downfall. Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ ya, chịa ya ọchị.
8 Jerusalem has sinned grievously; therefore she has become an object of scorn. All who honored her despise her, for they have seen her nakedness; she herself groans and turns away. Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.
9 Her uncleanness clung to her skirts; she gave no thought to her future. Her fall is astounding, with no one to comfort her. "Look, my Father, on my affliction, for the enemy has triumphed!" Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”
10 The enemy has stretched out his hand over all her precious things; she has watched the nations enter her sanctuary—those you had forbidden to enter your assembly. Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.
11 All her people groan as they search for bread; they trade their treasures for food just to stay alive. "Look, my Father, and see, for I have become despised. Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”
12 Is it nothing to you, all you who pass by? Look and see if there is any sorrow like my sorrow, which was brought upon me, which our Father inflicted on the day of his fierce anger. “Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, nke e mere ka ọ bịakwasị m, bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?
13 From on high he sent fire into my bones, and it overcame them. He spread a net for my feet and turned me back; he has left me desolate, faint all the day long. “O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
14 My rebellions were bound into a yoke; knit together by his hand, they were laid upon my neck, and he sapped my strength. The Sovereign Father handed me over to those I cannot withstand. “Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.
15 The Sovereign Father has rejected all the mighty men in my midst; he summoned an assembly against me to crush my young men. The Sovereign Father has trampled the virgin daughter of Judah as in a winepress. “Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.
16 For these things I weep; my eyes, my eyes flow with tears, for a comforter who could revive my spirit is far from me. My children are desolate, for the enemy has prevailed." “Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.”
17 Zion stretches out her hands, but there is no one to comfort her. Our Father has decreed that Jacob's neighbors would become his enemies; Jerusalem has become a filthy thing among them. Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.
18 Our Father is righteous, for I have rebelled against his word. Hear, all you peoples, and look on my suffering; my young women and my young men have gone into captivity. “Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
19 I called to my lovers, but they deceived me. My priests and my elders perished in the city while they searched for food just to stay alive. “Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.
20 Look, my Father, for I am in distress; my stomach churns, my heart is overturned within me, for I have been very rebellious. In the street the sword cuts people down; in the house it is like death. “Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
21 They have heard how I groan, with no one to comfort me. All my enemies have heard of my trouble; they are glad that you have done it. Bring on the day you have declared, that they may become like me. “Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.
22 Let all their evil come before you, and deal with them as you have dealt with me for all my rebellions; for my groans are many, and my heart is faint. “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]